Nwoke egbuola nne ya maka okwu ala

Mma

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke gbara afọ 42 aha ya bụ Chiedu Ikegwuonwu, onye Uruagu Nnewi dị na Anambara steeti ji mma gbuo nne ya ụnyaahụ ka ya na ya nwesịrị esemokwu maka ala nwanne ya nke ọ tọrọ.

Akụkọ kwuru na Chinedu ji mma gakwuru nne ya bụ Benedict nwechara ebe ọ na-esi nri si na azụ gbupụ ya isi, ma hapụkwa ụmụ ya na nwunye ya gbafuo.

A na-ebo ebubo na ihe na-ese bụ alaobi nwanne ya ọ tọrọ nke Chiedu chọrọ ị nara ya ma nne ya akwadoghị ya.

Na mkparịtaụka onyentaakụkọ BBC na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambara steeti bụ Haruna Mohammed nwere n'ekwenti, o kwuru na ihe a mere n'ezie mana o kwuru na odobeghị ha anya ihe mere nwoke ahụ jiri gbuo nne ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na adonyela nwaanyị ahụ n'ụlọozu maka ime nyocha, ebe ha ka na-achọ nwoke mere ihe a bụ onye gbarala ọsọ.

Harụna sịrị: "O bụ ezie. mana anyị amatabeghị ihe mere o jiri gbuo nne ya.

"E wetara anyị ozi na Chiedu Ikegwuonu dị afọ 42 ji mma wakpo nne ya bụ Benedeth Ikegwuonu dị afọ 67 gbuo ya mma n'olu na akpịrị.

"Ndị uweojji si ogige Sentraalụ Police Station gbagara ebe ihe a mere ma buga onye ihe mere ụlọọgwụ Akwudo ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla.

"Ka ọ dị ugbua, anyị adonyela ozu ya n'ụlọ ozu maka nyocha. Anyị na-agbakwa mbọ ịnwụchị nwa amadị ahụ gbarala ọsọ."

Akụkọ ga-amasị gị: