Ị pụtakwara kiri ọnwa ọbara?

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ụnụ amakwa na ọchịchị kpuchiri ọnwa n'abalị ụnyaahụ?

Naịjirịa sonyere mpaghara ndị ọzọ n'ụwa we hụ nwee chinjinabọ kachasị nọtee aka kamgbe afọ otu narị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọnwa ọbara na Indoneshia

Naịjirịa

Osote onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Ike Ekweremadu ekwuola na mgbochi e gbochiri ụlọ ya ụbọchị ole gara aga bụ nkata iji chutuo ya na onyeisi ya Bukola Saraki n'ọkwa,

Image copyright @ike_Ekweremadu
Nkenke aha onyonyo Ike ịda jụụ otụ nkeji banyere oke ogbugbu na-eme n'ala Naijiria agwụla Ekweremmadụ

Nakwa ịkwụsị ndị APC wufere PDP ka ha ghara iwufe.

Mana o kwuru na ya agaghị ekwe ka onye ọbụla majaa ya.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ndịgha Naịjirịa ahazigharịala ndịisi Lafiya Dole, bụ atụmatụ ha ji na ebuso Boko Haram agha.

Nke bụ ugboro anọ ewepụrụ onyeisi Lafiya Dole n'ime ọnwa iri na anọ, bụ ihe ndị ma maka ya kwuru bụ maka mwakpo ndị Boko Haram na awakpo ndịgha na nso nso a.

Akụkọ mba ofesi

Facebook abaala na nsogbu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye nwe Facebook mefukwara ego nke mere o jiri gbatuo n'ọkwa ndị kachasị nwee ego n'ụwa niile

Ọ dịka nsogbu gbasara ọkwụ ụgha nke Facebook na-enwe na-emetụtazi ya bụ dike na soshal midia.

Nke a bụ maka na ego e ji azụ oke na Facebook jiri pasentị iri na itoolu gbadaa ebe ha mefuru ihe ruru ndị dọla otu narị na iri abụọ.

N'akụkọ ndị ọzọ,

Egwu Drake na-ebutezi nsogbu na US

US akatọọla egwu na-ewu nke Drake kụrụ nke na-eme ka ndị mmadụ wutuo n'ụgbọala na-aga ịgba egwu.

Ụlọọrụ njem na US kwuru ka ndị mmadụ kpachara anya maka o nwereike ibute ihe mberede okporoụzọ

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPatience Ozokwor nke mbụ