Igbo Leaders of Thoughts: Jidenu ọkwa onyeisiala unu na 2023, anyị achọghị ya
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ndị otu Igbo Leaders of Thoughts akụwaala akụ oyibo nsugbe dịka ha kwuru ka ndị ji ọkwa onyeisiala afọ 2023 eto ndị Igbo akpịrị gbalaga maka na Igbo achọghị ya.

Ebe foto si, Amarachi Atama
Onyeisi ha bụ ọkammụta Ben Nwabueze kwuru ka ahazigharịa obodo ka ọkwa onyeisiala ahụ gharazi idi ire nke ukwuu nke iji ya na-eto ndị mmadụ akpịrị.
Otu ahụ kwukwara na ọ fọrọ nwaobere ihe ka a kpọọ Naịjirịa mba na-achịaghị aja ọbụla na mba lara n'iyi maka ụdị ọnwụ na ogbugbu a na-eme n'obodo.
Naịjirịa
Buhari ga-aga Lome taa.

Ebe foto si, Getty Images
O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja taa gawa Lome maka ọgbakọ Ecowas na Eccas.
Ecowas bụ mkpọbiri otu Economic Community of West African States na Bekee ebe Eccas bụ mkpọbiri Economic Community of Central Africa States.
Otu a na-ahụ maka azụmahịa na akụ na ụba mpaghara Afrịka ọkachasị mpaghara ọọ̄ịda anyanwụ Afrịka na ndị mpaghara etiti Afịrịka.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Nke a na-abịa dịka ọ gwasiri ndị na-akwara ya abịa ndọrọndọrọ maka ntuliaka 2019 ka ha wetuo obi n'oge erubeghi.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa
N'akwụkwọ ozi onyeisiala dere nke ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Femi Adesina binyere aka, o kwuru ka ndị nkwado ya jiri nwayọọ ma soro usoro Inec wepụara maka ntuliaka ahụ.
Buhari kwuru na e lee anya n'usoro ahụ Inec wepụtara, oge erubeghi maka ịchụ nta vootu nakwa ịkwa abịa maka ndọrọndọrọ.
O kwuru na oge na-abịa ime nke a nakwa ịgwa ụwa niile maka ihe niile ọchịchị Buhari merela mana ka onye ọbụla nọrọ jụụ ugbua.
Akụkọ mba ofesi
Ezigbo ọdachi na-ada na steeti Kalifonia nke dị na Amerịka maka nnukwute ọkụ ọgbụgba na-eme ebe ahụ.
Ụmụaka abụọ na nne ha ochie so na mmadụ ise nwụrụ n'ọkụ ahụ ji iwe na ọnụma agba.

Ebe foto si, AFP
Only 5% of the fire has been contained
Nke a bụ agbanyeghi na mmadụ abụọ so na ndị na-achụ ọkụ ahụ anwụbuola ụbọchị Tọzde ebe a na-achọ mmadụ iri na-asaa achọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ n'iri puku ha agbafuola n'ụlọ ha ịchọ ebe nwere nchekwa ha ga-anọ.
N'aka nke ọzọ ala ọma jiji emela n'otu ebe ndị nkiri na-aga na mba Ịndoneshia gbuo ihe ruru mmadụ iri.
Ala ọma jiji ahụ gbara na Lombok taa.
N'egwuregwu,
Chelsea jiri okpụ goolu ise a satara anọ na penariti merie Inter milan n'asọmpi International Champions Cup.
Oche goolu ndị Chelsea bụ Willy Caballero jidere otu bọọlụ Skriniar onye Milan gbara dịka ha ji otu ọkpụ gbaa onwe ha onye laba n'egwuregwu ha jiri bido asọmpi ahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Oriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.