Ebee ka Ekweremadu nọ ugbua?

Ike Ekweremadu

Ebe foto si, AFP

Akụkọ na-erute BBC Igbo ntị bụ na ngalaba gọọmenti etiti na-ebu agha megide nrụrụaka nke a kpọrọ EFCC n'aha ịchafụ ji osote onyeisi Sineti bụ Ike Ekweremmadụ.

Ndị niile BBC kpọrọ na-ekwe ntị ekweteghị na ha matara ihe ọbụla gbasara ozi a na-apụta.

Mbọ BBC gbara inweta ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadụ bụ Uche Anichukwu amịtaghị mkpụrụ n'ihi na ọ zaghị ekwe ntị ya.

Onu na-ekwuru Ekweremadụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Luke Mgboh kwuru na ya amaghị maka ya.

Mana otu onye welitere isi na PDP onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na EFCC ji ya kemgbe ụtụtụ. N'okwu ya ọ siri, "EFCC anwụchịghị ya kama ha kpọrọ ya oku maka ịgba ya ajụjụ ọnụ.'

O kwukwara na-ha ji ya kemgbe ụtụtụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị