EFCC ji Ekweremadu ọtụtụ awa - Onye PDP

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ihe nkiri na-eme na gọomenti Imo steeti apụtala n'ụdị ọzọ taa.

Eze Madumere

Ebe foto si, Channels TV

Ụlọikpe kwụsịrị idu iyi ọrụ Calistus Ekenze onye chọrọ ịnọchi Madumere taa.

Cheta na a chuturu Madumere ụnyaahụ agbanyeghi na ụlọikpe nyere iwu ka a kwụsị usoro ichutu ya.

Naịjirịa

N'Enugwu, ụlọọrụ NAFDAC machiri ngwọahịa ahụike na ọgwụ adịgboroja n'ọdọ ụgbọelu Enugu.

Ndị Nafdac

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi Nafdac n'ọdọụgbọelu ahụ bụ John Okwori kwuru na ihe ha machiri ruru nde naịra ise na ọma.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

EFCC ji Ekweremadu

Ike Ekweremadu

Ebe foto si, AFP

Akụkọ pụtara n'ehihie taa na-ekwu na ndị EFCC ji sinetọ Ike Ekweremadu kemgbe ụtụtụ ịgba ya ajụjụọnụ.

Mana mbọ BBC gbara iji nweta ihe e jiri kpọọ ya oku amịtabeghị mkpụrụ díka ọnụ na-ekwuru Ekweremadu n'ọwụwa anyanwụ bụ Luke Mgboh siri ka enye ya ohere ka ya mata nke bụ eziokwu.

Akụkọ mba ofesi

Akụkọ apụtala na o nwerike na ndị Not Koriya ka na-eme ngwọagha nuklia agbanyeghi ezi mmekọ dị n'etiti ha na Amerịka.

Trump na Kim

Ebe foto si, AFP

Otu onye ọrụ n'Amerịka gwara ndị ntaakụkọ na satilait na-ezute onyonyo gosiri na ha ka na-eme ngwọagha nuklia na nzuzo.

N'egwuregwu,

Ọgba bọọlụ otu Chelsea bụ Willian ekwuola na ka na otu egwu bọọlụ ahụ.

Willian

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ agbanyeghi na akụkọ pụtara na Real Madrid na Barcelona nwere mkpali ebe ọ nọ

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Oriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.