Bukola Saraki agbajọọla ndị APC

Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki agbajọọla ndị APC.

Saraki kwuru nke a n'akara Twitter ya na nkeji ole na ole gara aga.

Saraki ekwughị pati ebe ọ na-aba mana o kwuru na ya apụọla.

Mana gọọmenti etiti ekwuola na ha amaghị na onyeisi ụlọomeiwu sineti apụọla na pati APC.

Onye nkwuchiteọnụ gọọmenti etiti bụkwa mịnịsta ọrụ mgbasaozi dị n'aka bụ Lai Mohammed gwara BBC na a gwabeghi ha na Saraki apụọla na pati APC.

Onye nkwuchiteọnụ APC na Legos bụ Joe Igbokwe kwuru na ọ bụ ndị mgba okpuru na-apụ na pati ahụ.

N'okwu ya, "APC abụghị PDP, Buhari abụghị Jonathan, ọpụpụ ha enweghi ihe ọ ga-eme APC."

Mana n'elu soshal media, ụmụ Naịjirịa na-etu o si emetụta ha.

Tell the Mayor kwuru na ma ụmụ Naịjirịa ekwesiri ibe akwa ka ọ bụ ịchị ọchị gbasara ya, na ọpụpụ ya abụghị maka ụkpụrụ ọma ọ chọrọ igosi maọbụ maka ọganihu ndị mmadụ kama ọ bụ nhazi ọ na-eme maka onwe ya.

Abraham Itebu kwuru na o si PDP gaa APC na 2014 sikwa APC gaa PDP na 2018 na-ekwu na ha ji ụmụ Naịjirịa eti epele nakwa azụmahịa onwe ha.

Olusanjo Ewulomi kwuru na o kwesiri ị hapụ oche ya maka na pati na-akarịghị n'ọnụọgụgụ enweghi ike ịnwe oche ahụ.

Onye omeiwu ibe ya bụ Ben Murray Bruce kwuru na ya ji aṅụrị anabata Saraki na pati ha bụ PDP mana Saraka ekwughikwa na ya na-aga na PDP.

Otu pati PDP dekwara n'akara twitter na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki na-alọghachi na PDP.

Cheta n'izu gara aga, ndị ụlọomeiwu mmadụ 15 nọbu pati APC wufere pati PDP ebe ndị nnọchiteanya mmadụ 38 bụbu ndị APC wufekwara PDP na pati ndị ọzọ.

Akụkọ ga amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a