Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa

Ndị mmanwụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Igbo na-efe mmụọ dị iche iche

Gịnị mere Igbo jiri kpọ ajọ ọhịa ajọ ọhịa?

Ị mara na ajọ hịa ka nọrọ ruo ugbua n'ala Igbo?

Gịnị bụ ajọ ọhịa?

Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum nke Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na Igbo kporọ ebe a ọhịa mmụọ, ọbụghị ajọ ọhịa dịka ọtụtụ mmadụ na-akpọ ya ugbua.

Dịka Igbo siri were nkwenye, ọhịa mmụọ bụ ebe ha na-efe chi biri n'Ala. Ebe a burukwa ebe ha na-asụpụ onyeọbụla Ala bụrụ ọnụ.

Ala

N'ala Igbo Chukwu kachasị mkpa, mana mmụọ na-eso ya bụ Ala.

Nnabuihe kọwara na ala Igbo were nkwenye na Ala bụ mmụọ mụpụtara ihe nịịle dị n'ụwa.

Ala sọ njọ (njọ Ala bụ igbuọchụ)

Igbo were nkwenye na Ala, na-ahụ ihe niile, nke a pụtara na onweghi njọ ọbụla ị ga-ekpuchi n'anya ya.

Nkenke aha onyonyo Ajọ Ọhịa ka dị na-ala Igbo ruo ugbua

Ala ga-akụ onye a ọrịa kpam kpam.

Lee ọrịa Ala na-akụ ndị mere ya njọ

  • Ara
  • Ekpenta (Leprosy)
  • Afọ ọzịza
  • Nzịza (Dropsy)
  • Ibi(hernia)

Nnabuihe kọwara n'oge ahụ, o nweghị dibịa ga-anwa anwa ịgwọ ọrịa ndị a anyị kpọrọ aha.

Onye ọbụla were ụdị ọrịa kwesiri ikwupụta njọọ o mere kpamkpam tupu ọ nwụọ. Ọ bụrụ na ọ saghị asịsa njọ o mere, ha ga-asụpụ ya n'ọhịa mmụọ.

Ihe ndị ọzọ dịka ịkwa iko di maọbụ nwunye onye ọzọ, maọbụ ịmụ ejime nakwa ọrịa agwọta agwọta nwere ike imee ka Ala bụọ onye ahụ ọnụ.

Nsụpụ mmadụ abụghị njọ

Dịka Nnabụihe jiri kọwa, nsụpụ onye a bụ maka ịzọ isi ụmụ ya nakwa ezinaụlọ ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụka Krist bụ okwukwe kachasị n'ala Igbo

Igbo n'oge gboo nwere nkwenye na onye ọbụla nabatara onye a anabataala iwe Ala n'ezinaụlọ ya.

Ebe ka ọhịa mmụọ di n'ala Igbo ugbua

  1. Mkpa Mbaise n'Imo steeti
  2. Ogwugwu ọkụ n'ime Okija
  3. Mbitoolu ala ogbaga
  4. Ihiala
  5. Arusi Ọkịja

Omenala Igbo na-anwụ anwụ

Nnabuihe kwuru na ihe a bụ nke kachasị njọ na-eme ugbua n'ala Igbo.

O kwuru na: "Omenaala dị iche iche n'ala Igbo n'anwụ maka ụka Kraist batara n'ala Igbo, ndị mmadụ emetọọla ọtụtụ ọhịa mmụọ a, o nweghị onye na-atuzi egwu ọhịa a"

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara