Ndị Falconets ga-eme ọfụma - onye nkuzi bọọlụ
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Adịghị akwado ha ọfụma mana Falconets ga-erite ihe - Ogochi Anya

Ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị ekwuola na olileanya dị ebe ndị otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa nọ na ha ga-eme nke ọma n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ụmụnwaanyị.

Asọmpi a bụ maka ndị na-erubeghi afọ 20 nke a na-agba na mba France.

Onye na-akuzi bọọlụ bụ Ugochi Anya gwara BBC Igbo na ya nwere ntụkwasịobi n'ụmụnwaanyị ndị gara asọmpi ahụ.

N'okwu y; "N'ihi na m na ha anọla mbụ, mgbe m ka na-agba bọọlụ, ha na-akwado ọfụma."

O kwukwara n'ezie na ya kwenyere na ha ga-atụrụ ugo wee lọta Naịjirịa, na ha agaghị agba aka lọta.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara