Bilienu were oche na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa - Nwunye Osibanjo

Nwunye osote onyeisiala Image copyright Dolapo Osibanjo/ Facebook

Nwunye osote onyeisiala bụ Dolapo Osibanjo agwala ụmụnwaanyị Naịjirịa ka ha kwụsị ịranye akara aka ụmụ ha n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwesighi ntụkwasịobi.

Nwaanyị Osibanjo gwara ụmụnwaanyị ka ha bilie ma were ọnọdụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

Osibanjo nọ na mbara ogige Alex Ekwueme n'Ọka dị n'Anambara steeti wee gwa ụmụnwaanyị n'ọgbakọ a kpọrọ Anambara Mothers 2018.

O kwuru na ndọrọndọrọ bụ ebe a na-anọ eme mkpebi gbasara eti ihe si aga n'obodo nke ga-ekwu etu ndụ ndị mmadụ n'obodo ga-adị.

Nwaanyị Osibanjo kwuru na ugbua abụghịzi oge ụmụnwoke na-eme mkpebi n'ihe niile gbasara ụmụnwaanyị.

N'okwu ya; "Ọ bụghị naanị ka unu banye ndọrọndọrọ mana nyenụ ndị niile nọ n'ime ugbua nkwado tọrọ atọ ma họrọnụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwere ntụkwasịobi ga-eme ihe ha kwuru."

N'akụkụ nke ya, nwunye aka na-achị Anambara steeti bụ Ebelechukwu Obiano kwuru ka ụmụnwaanyị bilie sonye ma weta mgbanwe nke obodo Naịjirịa chọrọ ugbua.

Ọtụtụ ekwuola na ụmụnwaanyị bụ ndị na-apụta akwara ụmụnwoke abịa oge ịchụ nta vootu mana ụmụnwaanyị anaghị apụta n'onwe ha ebe ụfọdụ ndị pụtakwara anaghị enweta nkwado n'aka ụmụnwaanyị ibe ha.

Cheta na ụmụnwaanyị ndị omeiwu agwaala onyeisiala Mohammadu Buhari na ha chọrọ ka ụmụnwaanyị nwee otu ohere inweta oche dịka ụmụnwoke nwere n'ụlọomeiwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: