Osote gọvanọ Kano steeti etinyela akwụkwọ arụkwaghị m taa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ndi agha Naịjirịa etiela ndị ọchịehi mmanwụ na Benue steeti.
Isi ulọọrụ ndị agha Naịjirịa kwuru na ha meriri ndị ọchịehi ahụ n'agha egbe ha abụọ kwatara ebe ha gbagburu ụfọdụ, ụfọdụ agbalaga.
Naịjirịa
Osote gọvanọ Kano steeti bụ Hafiz Abubakara agbala arụkwaghị m taa.
Akụkọ BBC Igbo na-enyochakwughi na-ekwu na Abubakara tinyere akwụkwọ alụkwaghị mgbe ọ nụrụ na mmadị iri atọ na otu n'ụlọomeiwu ebinyela aka n'akwụkwọ ichutu ya.
Akụkọ na-ekwu na ụlọomeiwu chọrọ ichutu ya maka na ọ na-akwadọ onye bụbụ gọvanọ steeti ahụ bụ Rabiu Kwankwaso bụ onye siri APC pụọ banye PDP.
Akụkọ mba ofesi
Ala ọma jijiji dị egwu awakpola Lombol n'Indoneshia, otu izuụka ka nke gburu mmadụ iri na ise mesiri.
Ebe foto si, EPA
Some buildings, including this shopping mall, were damaged in the earthquake
O metụtarakwara ndị agbataobi ha na Bali ebe ndị ọrụ gọọmenti gwara ndị mmadụ ka si n'akụkụ mmiri pụọ.
N'egwuregwu,
Ọgba bọọlụ mba Snegal bụ Demba Ba ebela nwịị na a kpasoro ya oke agbụrụ na China ebe ọ na-agba bọọlụ ugbua.
Ebe foto si, Getty Images
Ba gbaara West Ham, Newcastle na Chelsea n'asọmpi Premia Lig
Onye nleta ya bụ Wu Jingui kwuru na ọgba bọọlụ otu egwuregwu Yatai gwara Demba ajọ okwu ụnyaahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Ike Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ