Ndị na-agba bọọlụ n'Enugwu nwere obi mgbawa maka ọnwụ Supremo

Supremo Image copyright Anozie Kelechi

Onye nkuzi bọọlụ a ma ama dịka Jaganza Supremo kuziburu ụfọdụ otu bọọlụ na Naịjirịa anwụọla taa.

Dịka akụkọ si kwuo, Supremo kuziburu otu egwu bọọlụ N-WL1 na Lamray United.

E kwuru na Supremo kwuru okwu maka obi mgbu dịka o gwuchara egwu n'abalị ụnyaahụ mana o mechara nwụọ n'isi ụtụtụ taa.

Ọtụtụ ndị hụrụ bọọlụ n'anya gara na soshal midia ikwu etu ha si nwee obi mgbawa maka ọnwụ a.

Otu onye ọkachamara n'egwu bọọlụ n'Enugwu bụ Osondu Ngwude, gwara BBC Igbo na Supremo bụ otu onye na-achọpụta mana azulitekwa ndị ọgba bọọlụ oge ha dị obere n'otu bọọlụ nta.

N'okwu ya; "Spremo bụ otu nkuzi bọọlụ na-aba n'ime obodo achọpụta ndị nwere onyinye ịgba bọọlụ.

"O so na ndị zụlitere ọgba bọọlụ Okocha oge ọ nọ n'Enugwu."

Ngwude kwuru na o chọrọ ịlọghachite tinye isi n'otu welitere isi dịka Delta Force mana o melighizi tupu ọ laa mmụọ.

Supremo so n'aka ochie ndị nkuzi egwu bọọlụ na Naịjirịa, n'okwu Ngwude; "O so n'otu Christian Chukwu na Shaibu Amodu lagokwara mmụọ."

Image copyright Anozie Kelechi

Ihe ndị ị na-amaghị maka Supremo

  1. Ezi aha ya bụ Sunny Ogbonnaya Chukwu
  2. Ọ bụ onye Uburu dị n'Ebonyi Steeti
  3. Ọ bụ nwa nke anọ n'ụlọ ya
  4. Ọ lụrụ nwaanyị ma nwee ụmụ anọ

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Zico Martinez nọrọ na Facebook bee akwa arịrị maka ọnwụ onye nkuzi ya

Gbenou Nestor bere nwịị na dike alala na Naịjirịa maka ụbụrụ ya bụ ego ya.

Austin Okafor ka na-ekpe ka ọ bụrụ asị.

Gbenou Nestor kwuru n'otu "All Stars" na Naịjirịa tufuru ihe buru ibu n'ọnwụ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: