Anambra steeti ga-enyocha ndị ji ya ụgwọ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Ipob amapụtakwala ọzọ wegharịa udo nke ohaneze ndi Igbo na ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ nwere.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ

Ha kwuru na ọ bụ maka na ha enweghi ike ịkwụsị mmachi a machiri Ipob dịka otu na-eyi egwu.

Naịjirịa

Anambara steeti chịkwa ọkụ eso ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na steeti ahụ, ha achọghị ndị anaghị atụ ụtụ isi cha cha.

Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti

Steeti ahụ ekwuola na onye ọbụla chọrọ ịma akwụkwọ n'akụkụ ebe ọbụla iji chụ nta vootu ga-akwụ ụtụ so ya.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ndị ụlọomeiwu ga-enwe nzụkọ ụbọchị Tuzde n'izu na-abịa maka bọjetị a chọrọ ịgbakwunye na nke 2018.

Image copyright @NGRSenate

Osote onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Yusuff Lasun kwuru nke a ụnyaahụ ka ndị otu ha nọ na pati APC mesịrị ọgbakọ nke otu PDP kwukwara na ha ga-esonye.

Akụkọ mba ofesi

Nọt kọrịya abarala Amerịka mba na ha ka na-enye ha ntaramahụhụ maka ngwọagha nuklia ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Trump na Kim kwesiri ịkparịta ụka n'abalị iri na otu ọnwa Juun na mba Singapore

Ha kwuru na ha agaghị akwụsị ime ngwọagha ahụ ma ha jiri ụdị aka ahụ nke ha kwuru na ndị na-eme mkparịtaụka gbasara ya anaghị eso ebumnobi Donald Trump.

N'egwuregwu,

N'egwuregwu, ndị n'ọchị ndị na akwa dịka e mechiri ohere ịzụrụ ndị ọgba bọọlụ n'asọmpi Premia Lig.

Mana ndị ntorobịa ji ọnụ na-eche ya bụ asọmpi ga-amalite taa nke otu egwu bọọlụ Man United na Leicester City ga-ebido.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKedụ ka Igbo si ahụta ụmụnwaanyị?