Yemen: UN etinyela ọnụ n'ụmụaka 29 ndịagha Saudi gburu na Yemen

Onye merụrụ ahụ ka a na-agwọ Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Otu ICRC kwuru na ha na-enyere ụlọọgwụ ndị nwere ọtụtụ ndị ọrịa aka site n'inye ha ngwọ ọrụ

Onyeisi ngalaba UN na Yemen bụ Martin Griffiths sị na yabụrụ na agha Yemen akwụsịghị, obodo ahụ ga-akanjọ karịa Syria.

Cheta na ihe karịrị ụmụaka 29 anwụrụ ebe mmadụ 30 ndị ọzọ merụrụ ahụ ụnyaahụ ka ndịagha Sawudi ji ogbunigwe elu buso ndị Yemen agha.

Ụmụaka ahụ nọ n'ime ụgbọala kwusiri n'ime ahia mbge ogbunigwe ahụ ndị Sawudi tụrụ na Dahyan dị na mpaghara Saada dara.

Ngalaba ọrụ ahụike nke Houthi na-ahazi kwuru na mmadị 43 bụ ndị nwụrụ ebe mmadụ 61 bụ ndị merụrụ ahụ.

Otu na-akwado mba Yemen na-ebu agha emegi ndị Houthis kwuru na ha kpachara anya mee ihe ha mere.

Mana ha na-ekwu na ọbụghị ndị nkịtị ka ha kwadoro agha ahụ mana ndị na-ahụ maka oke na ugwu diri mmadụ na-ebo ha ebubo na ha tụrụ ogbunigwe n'ime ahịa, n'ụlọakwụkwọ, n'ụlọọgwụ nakwa ebe ndị mmadụ bi.

Mba Amerịka, bụ ndị na-eresi Saudi Arabia ngwa agha ha ji anu ọgụ, katọrọ arụ a mere ma sị ka Saudi me nyocha iji mara etu o ji mee.

N'aka nke ọzọ, onye ọrụ UN e wetara ọhụrụ ịnọchite Yemen bụ Martin Griffiths kwuru na ya na-atụ anya ime ọgbakọ n'etiti ndị na-ese okwu a n'ọnwa Sepụtembba na Giviniva ka ha nwee mkparịtaụka.

Isiokwu Ndị Emetụtara