Falz akatọọla NBC maka ịmachi egwu #ThisisNigeria

#ThisisNigeria Image copyright Falz/Youtube
Nkenke aha onyonyo Falz: #ThisisNigeria ebe mmadụ niile bụ onye omekeome

Ngalaba gọọmenti na-ahazi mgbasaozi n'ikuku nke a kpọrọ 'National Broadcasting Commission (NBC)', agọọla na ha amachighị egwu otiegwu Folarin Falana ama dịka Falz a kpọrọ #ThisisNigeria na egwu ndị otiegwu ndị ọzọ.

Falz katọrọ NBC n'igwe okwu Instagram ya maka idegara ụlọọrụ mgbasa ozi n'ikuku akwụkwọ sị ha kwụsị ịkpọ egwu #ThisisNigeria (Falz), Iskaba(Wande Coal nakwa See Mary, See Jesus(Olamide) n'ihi na ha nwere "okwu na-asọ oyi na ntị" nakwa ịda otu ụlọọrụ redio dị na Jọs, nha narị puku naira maka ịkpọ egwu ndị a.

Nkenke aha onyonyo Folarin Falana, (Falz) ekwuola na ya agaghị ewezuga ihe nkiri egwu ọhụrụ o tipụtara

N'ịkwa emu, Falz kwuru na "Nke a bụ Naijiria ebe onye ọbụla bụzị onye omekome bụ okwu na-asọ oyi na ntị."

Mana n'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuchitere NBC bụ Maimuna Jimada gọrọ na NBC amachighị egwu #ThisisNigeria dịka e si bo na ebubo.

O kwuru na NBC "enweghị ikike ịmachi egwu ọbụla mana anyị nwere ike ịdọ ndị ọrụ mgbasa ozi aka na ntị banyere ihe na-asọ ntị oyi dị n'egwu ụfọdụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ha kwesịrị ime bụ ịga hichapụ akụkụ egwu ndị ahụ adịghị mma na ntị "mana nke abụghị na ndị mmadụ enweghị ike ịga zụrụ egwụ ndị ahụ ebe o zuru oke kpọọ n'ụlọ ha."

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mmachi ahụ

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akatọ ụkwụ ahụ NBC zọpụrụ.

@Shawnife kwuru na ala anyị a kpọrọ ndị na-ekwu eziokwu asị.

@Osacruz kwuru na ha hapụrụ ịmachi egwu na ihe nkiri na-akwado ajọ ihe, machie nke na-ekwu maka nsogbu ndị ala Naijiria na-arịa.

@Iam_Abdulaxis jụrụ na dịka a machiri egwu Falz, Naijria ọ ga-aghọkwa nnukwu mba ọzọ?

Akụkọ ga-amasị gị: