Enyi mmiri atagbuola onye mere njem gaa Kenya

Pepa hippo na Medellin, Colombia Image copyright AFP

Onye mba Tayiland gara njem nkiri na Kenya anwụọla ka enyi mmiri tasra ya ebe ọ na-achọ ise foto.

Chan Ming Chuang dị afọ 66 nọ na-eso ya bụ anụmanụ n'ebe nkiri dị n'akụkụ mmiri Naivasha na nso isi obodo Kenya bụ Nairobi.

Onye ọzọ na-emekwa nkiri bụkwa onye mba Tayiland merụkwara ahụ ebe ahụ. Mmadụ isii anwụọla n'aka hippo n'akụkụ ebe ahụ n'afọ a.

Ebili mmiri na-ebupụta anụmanụ ahụ buru ibu nke ukwuu n'ala ebe nkiri ahụ ebe ha na-achọ nri.

Ndị ọrụ nchekwa anụmanụ ọhịa na mba Kenya kpọburu ndị ahụ ndị China mana ndị isi mba Tayiland pụtara kwuo na ha bụ ndị obodo ha.

Kenya na Tayiland enweghi njikọ ọbụla mana ha na-anabata mkpesa ha na-eme gbasara ala ahụ mmiri gbara gburugburu.

Ndị hụrụ oge ihe a mere kwuru na mmadụ abụọ gakwuru anụmanụ ndụ nso karịa. E bugara onye nke ọ tara n'ụlọọgwụ ozugbo ebe ọ na-agba ọbara nke ukwuu mana o mesiri nwụọ.

Enyi mmiri na-awakpo mmadụ rie nne ma nwee eze dị nkọ ma bukwa ibu nke ukwuu we na-egbu ihe ruru mmadụ 500 na mpaghara Afịrịka kwa afọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara