Ụmụ Igbo nọ Ghana: Gọọmentị Ghana na-akpagbu anyị

Ahịa Makola na mba Ghana Image copyright Getty Images

Kizito Obiora bụ onyeisi ndị Naịjirịa na-azụ ahịa ebe ahụ gwara BBC Igbo na ụmụafọ Naịjiria na ndị ogbo ha n'obodo ahụ enweela nkwekọrịta na udo ga-achị.

Maazi Obiora kwuru na nke a mere maka esemokwu dara n'etiti ndị Naịjirịa na ndị Ghana.

Nkenke aha onyonyo Ndị ọchịchị Ghana e nyela iwu maka etu ndị Igbo na-ere ahịa ga-esi na-ere ahịa n'obodo ha.

Ọ si na nsogbu a bidoro ka gọọmenti Ghana wetara atụmatụ na ndị Naịjirịa na ndị mba ọzọ kwesịrị inwe ihe Bekee kpọrọ "equity" ruru nde dọla.

Onye wepụtara atụmatụ a bụ minista na-ahụ maka azụmahịa.

Obiora kwuru na agbanyeghị na atụmatụ abụghị ihe ọhụrụ, maka na gọọmenti rituru n'ọchịchị chọrọ ime ya, ozighi ezi ugbua etu ozighi ezi mgbe ahụ.

Nkenke aha onyonyo Ndị ahịa akụrụngwa na-esikarị mba ofesi enweta ngwaọrụ ha

N'agbanyeghị na ahịa ga-emepe echi, Obiora sị na ọ bụ nkata gọọmenti Naijiria na nke Ghana kpara mere ha jiri gbanyụọ ọkụ.

Ma kwukwa na ha si ụzọ ọzọ bata.

Nyocha ndị na-enweghị "equity" nke ga-amalite echi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnyị kara ime karịa nke a ma ọ bụrụ na ndị gọọmenti nye anyị aka

Otu onye sị na ihe a ga-emetụta ya bụ Nwafor Akajiofor, bụ onye na-azụ ahịa n'Ahịa Magazine.

Akajiofor kwuru na okwu 'resident permit na equity' bụ atụmatụ gọọmenti Ghana ji chọọ ịchụpụ ụmụ Naijiria na Ghana.

O kwuru na akwụkwọ na-enye ikike ibi na Ghana bụ 'resident permit' abụghị ihe dị mfe inweta.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ndi na-amụ ọrụ kwesịrị ịma

"Resident permit ahụ na-ericha 200,000, mana inweta ya abụghị ebe o biri."

Obiora na onwe ya sị na ihe na-agba anyammiri bụ na iwu Ghana hibere bụ na ndị mba ọzọ agaghị azụ ahịa n'ime ahịa.

"Ndị nwere akwụkwọ zuru ezu agaghị aganwu n'ime ahịa zụọ ahịa, ọ bụ naanị n'okporoụzọ ka ha ga-enwe ụlọahịa, dịka iwu a siri kwuo."

Dịka o si kwuo, ọ bụrụ na ndị Ghana gaa n'ihu sobe iwu a, ọtụtụ ụmụafọ na mba ahụ ga-ala makana ha agaghị emenwu ihe dị na ya.