Lee ihe ụfọdụ ndị lụrụ di na nwunye mere oge mkpa mmekọrịta ji ha

Aha nkeananụānụ,

'Ihe pụrụ iche mere oge mkpa mmekọrịta ji m'

Di na nwunye ịnọkọ bụ ihe dị oke mkpa n'ezinaụlọ n'ihi na ọ na eme ka adịmma ha tọọ atọ.

Mana ọtụtụ oge, ọrịa, esemokwu, ụzọ ite aka, maọbụ aghọtaghị mkpa mmekọ nwoke na nwunye dị nwere ike ime ka nnọkọ bụrụ ihe dị mfe.

Mkparịta ụka a malitere maka akụkọ pụtara na Nwoke 'kọnji' ji dinara nwunye ya n'ụlọọgwụ na mba Uganda.

Na mkparịụka BBC Igbo na ụfọdụ ndị lụọra di na nwunye nwere, ha kọpụtara ihe ha merela oke ha nnoọkọ di nna nwunye dị ha oke mkpa:

Mazị Kachi Okorie bụ nwoke lụrụ nwaanyị ọnwa anọ gara aga sị, "Aka m nụrụ nwaanyị ọhụrụ. O yidera m, ọ na-enye ya mgbe ọbụla m chọrọ ya nkmke na abụkarị n'abalị ma m nata ọrụ."

Oriakụ Adaeze: "Efeela m ụgbọelu si Legọs fega Asaba ga hụ di ebe ọ gara ọrụ n'Asaba.

"Sị nwoke lee ihe m chọrọ. Ya mee ihe o kwesịrị ime ka m gaghara ịgakwuru nwoke ọzọ. O nye m ya ozigbo,ozigbo n'ụlọọrụ ha."

Onyeka Nkeme kwuru na agụ ya na nwunye ya ịnọkọ ebugala ya njem isi Legọs gawa Calabar.

"Oge ahụ nwunye ji otu afọ efe ala nna anyị. A gbara ụgbọala gawa Calaba mụ na ya nọkọọ. Anọkwara abalị ole na ole tupu m lọghachi."

Mana e nwekwara ụfọdụ dịka Oriakụ Philo Okafor ndị kwuru na o nweghị ihe pụrụ iche ha merela ka nwere mkpa ịnọkọọ karịa ịgwa dị ya ma ọbụ nwunye ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị