Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Anthony Nwakaeme ahọrọla Naịjirịa karịa 'ego'

Akụkọ dị mkpa mere na mgbede a

Image copyright Getty Images

Anthony Nwakaeme bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa ajụla otu egwuregwu ụfọdụ ndị chọrọ ya na mba Chaịna n'ihi olileanya o nwere ịsonye na Super Eagles.

Na nkọwa ya o kwuru na ihe niile abụghị maka ego.

Atiku wuru ewu taa

O kwuru na ya na-emegharị ahụ ma gbasie ike mana ọ bụghị atụmatụ ahụ ka-eji ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala.

N'ọnụ ya "m ga-arụ ọrụ n'abụghị ịga ije"

Ndọrọndọrọ ọchịchị

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ichi ehi bụ otu n'ime ọrụ e ji mara ndị sina mpaghara ugwu ala Naịjirịa

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP enyela onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammdu Buhari elekere iri abụọ n'anọ ịnwụchi onyeisi otu Miyetti Allah maka mmaja ha majara Bukola Saraki.

PDP na-ekwu na okwu a gosiri na Miyetti Allah na otu ndọrọndọrọ APC na-egbunye n'otu akpa

N'otu aka ahụ ndị mmadụ na-akatọ otu Miyetti Allah nke mere na aha ha na-ewu na soshal midia Twitter n'ihi okwu a ha gwara Bukola Saraki.

Cheta n'ụlọọrụ Punch kwuru na onyeisi ha na Benue steeti kwuru ka Bukola Saraki ritue n'ọkwa dịka onyeisi ndị ụlọomewu sineti maọbụ ha kwapu ya.

Na mba ofesi,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ katọrọ Trump maka etu ndị ọrụ na-ahụ maka ime obodo jiri na-ekewa ezinaụlọ, ọkachasị umụaka na nne na nna ha

Dịka okwu gbasara onye ọkaiwu Trump na-akpọtụ, nwoke nọ n'etiti ihe a bụ Michael Cohen apụtala ịkụwa akụ oyibo nsugbe.

Cohen kwuru na ọ dị njikere ị kwado nyocha ọbụla a chọrọ ime dịka amara ya ikpe ida iwu gbasara ego.

Gee Nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile