Afịaọlụ Nnewi atala isi otu nwoke

Ijele Image copyright Mazi Nwonwu

Otu onye bi na Nnewi gwara BBC na mmanwụ ji karama sugbuo otu nwoke n' Orie Agbo dị na Nnewichi, Nnewi, Anambara steeti n'ụbọchị Toosde.

Dịka nwoke ahụ achọghị ka akpọ aha ya siri kọwa, ọ bụ ọgụ onye-ka-ike dapụtara na-etiti otu mmanwụ abụọ butere ka a sugbuo otu nwoke a mabeghị aha ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n' Anambara steeti bụ Harụna Mohammed azaghị ekwentị ya mgbe BBC kpọrọ ya.

Ka ọ dị ugbu a otu ọgbakọ Nnewi a kpọrọ 'Nzukọra Nnewi n'ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Ike Edoji wepụtaraenyela iwu ka ndị ọrụ nche nwụchie mmanwụ ọbụla ji ụtali maọbụ ngwa ọgụ.

Cheta na Afịaọlụ bụ emume ịgba mmanwụ na-eso owuwe ihe ubi ndị Nnewi na-eme kwa afọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: