Akụkọ kachasị mkpa taa: Ihe Angela Merkel ga-eji maka ya bịa Naijiria

Onyeisi ndị uweojii adọọla FSARS aka na ntị

Image copyright Getty Images

Dịka ka anyị si ekwu okwu SARS, onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris enyeela mkpebi ka otu ọhụrụ akpọrọ Federal Anti-Robbery Squad sepuo aka n'ihe niile nanị gbasara ohi maọbụ nke na-eleba anya na ndị tọrọ ndị mmadụ.

O kwuru na ụlọọrụ ya ga-anabata mkpesa onyeọbụla nwere maka ụlọọrụ ọhụrụ a

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-azi ntuliaka na Naịjirịa INEC ekwuola na mmadụ kariri nde iri na atọ bụ ndị denyere aha dịka ndị ga-eso na ntuliaka 2019.

Cheta kwa na taa ka Imo steeti ga-eme ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti mana parti dịka PDP na APGA ekwuola na ha ga-esepu aka na ntuliaka a makana onweghị onye gwara ha maka ya.

Angela Merkel ga-abịa Naịjirịa

Image copyright Getty Images

N'mba ofesi, aka na Germany bụ Angela Merkel ga-abịa njem a'ala atọ n'ime Afrika maka ị nwe mkparịtaụka gbasara ndị mbiambiara.

Merkel ga-enwe mkparịta uka na Senegal, Ghana na Nigeria, bidoro n'ụbọchị iri abụọ ni itoolu ruo ụbọchị iri atọ nb'otu n'ime ọnwa a.

Eniela Ras Kimono taa

Image copyright Getty Images

Na ngwụcha, taa ka ha ga-eli Ras Kimono na bee nna ya n'Onicha Olone n'ime Delta steeti.

Ras Kimono bụ oti egwu reggee nke ama ama nke ọma.

Gee akụkọ anyị taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye