Ihe asaa nwere ike iduga gị nga ma i mee ya nwa gị

Mkpọrọ
Nkọwa foto,

Nne na nna nwere ike ịga nga maka ịkwụwa nwa ha agụụ

Nne na nna ụfọdụ amaghị ikike nwa ha na nwa ndị ọzọ ha na ha bị nwere.

N'ihi nke a ọtụtụ ha na-azọhie ụkwụ n'ụzọ megidere iwu dịka ha na-agbaziri ụmụ ha.

Lee ihe ụfọdụ nwere ike ịbụga nne na nna na mkpọrọ ma ha mee ya nwa ha:

Ihe ndị a bụ dịka Joy Uzoho, onyeisi na ụlọọrụ otu na-alụ ọgụ maka ikike dịri ụmụnwaanyị na ụmụaka a kpọrọ 'African Women and Children Care Support Initiative siri kọwa ya:

1. Nwata ibubiga ọnụ oke

Otu nne na nna Naijiria dabanyere n'aka ndị uweojii ndị tụbara ha na mkpọrọ n'Amerịka ebe ha bi n'ihi ime ka ụmụ ha soro ha buo ọnụ abalị 40, nke mere ka otu nwa ha nwụọ n'agụụ.

Uzoho kọwara n'iwu Naijiria, nne na nna mere ụdị ihe a ga-adabanye n'otu nsogbu ahụ n'ihi na "ụmụaka nwere ikike ịdị ndụ."nwata enweghị ume ibu ọnụ ka okenye."

2. Enyeghị nwa ara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ara bụ ezi nrị na-eme ka ụbụrụ ụmụaka na-acha ọkụ

Nwaanyị ọbụla jụrụ inye nwa ya ara n'ihi egwu na ara ya ga-ada na-emegide iwu.

Uzoho sị, "Onye ọbụla mụrụ nwa kwesịrị inye ya ara n'ọnwa isi mbụ ya. Onye emeghị etu a dịka ụfọdụ ndị ọgbaraọhụrụ na-asị na ara ha ga-ada kwesịrị ịta ahụhụ n'ihi na o megidere iwu"

3. Ịwakpo maọbụ imetọ nwata

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Mmetọ ụmụaka bụ nsogbu na-arị elụ na Naijiria ugbua

Nke a bụ okwu bụ chi bọọ, a nụ ọzọ dịka akụkọ mmetọ ụmụaka na-apụta ụbọchị ọbụla.

Dịka iwu Naijiria siri kwuo, onye metọrọ nwa erubeghị afọ 18 ga-aga nga mkpụrụ ọka

4. Enyeghị nwata na-arịa ọrịa nleta kwesịrị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Nwata ọbụla nwere ikike nleta

Nne na nna eletaghị nwa ha ahụ adịghị nwere ike ịga nga ma ihe mee nwa ahụ.

Uzoho kọwara sị, "Nwatakịrị na-arịa ọrịa, ị chọghị ụlọgwụ ị ga-akpọga ya, onwe ihe mere nwa ahụ, nne na nna ahụ ga-aga mkpọrọ."

5. kpchi nwata n'ụlọ

Ụfọdụ ndị nne na nna na-akpọchi ụmụ ha n'ime ụlọ iji chekwa ha iso ajọ otu maọbụ maka nchekwa mana Uzoho kọwara na o nwee ihe ọdachi mere nwata n'ihi na a kpọchiri ya n'ụlọ na nne na nna ya ga-abanye nsogbu nwere ike ibuga ha mkpọrọ.

6. Azụghị nwa n'akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Nwata ọbụla ikike ịgụ akwụkwọ

Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị eziga ụmụ ha maọbụ nwa ha na ha bi ụlọakwụkwọ.

Ha na ahara iziga ha ahịa maọbụ ọrụ dịka ibugharị ahịa, ọrụugbọ, maọbụ ọrụ ndị ọzọ mgbe ndị ogbo ha nọ n'ụlọakwụkwọ.

Ndị nne na nna na-eme otu a nwere ike ịdaba na nnukwu nsogbu n'ihi na iwu Naijiria nyere nwata ọbụla ikike ịgụ akwụkwọ.

7. Ịmụ nwa ị gaghị azụli

Ị mara n'ike adịghị gị inweta ego ị ga-eji zuo ụmụ gị, ị mụọ ole ị ga-azụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: