Falana: #FSARS egboghị nsogbu ihazigharị ọrụ nchekwa ndị uweojii

Femi Falana Image copyright Femi Falana/Facebook
Nkenke aha onyonyo Femi Falana kwuru na uweojii steeti ga-egbo nsogbu nchekwa na Naijiria

Falana bụ onye ọkaiwu ama ama kpọrọ oku ka e nwee ndị uweojii nke steeti, sị na o nweghị mba a na-enwe naanị ndị uweojii etiti.

O kwuru na ọ bụ ndị uweojii steeti ga-egbo nsogbu nchekwa a na-enwe ugbua n'ala Naijiria ma gwa ndị gọvanọ ka ha kwado ndị uweojii steeti.

Ọ tụrụ arịrị na ndị gọvanọ anaghị eji ohere e nyere n'iwu ala Naijiria tinye anya n'etu ọrụ ndị uweojii si aga.

"Iwu Naijiria nyere ohere ka e nwee ngalaba na-ahụ maka ndị uweojii a kpọrọ 'Nigerian Police Council' na Bekee".

"Ngalaba onyeisiala nọ dịka onyeisioche, ebe onyeisi ndị uweojii, onyeisioche kọmịshọn na-ahụ maka ndị uweojii nakwa ndị gọvanọ steeti 36 sonyekwara.

"Mana ọ dị mwute na ndị gọvanọ anaghị etinye aka ka ọrụ ndị uweojii si aga dịka iwu Naijiria siri kwado."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye kọmishọna uweojii nọ ezumike nka kọwapụtara uche ya gbasara uweojii steeti

Na nke yiri ibe ya, Falana nọ ebe ọzọ katọo okwu Onyeisiala Muhammadu Buhari, ebe o kwuru na ichekwa ala Naijiria ka mkpa karịa ikike dịrị onye, sị ' Mbọ izu na azụ mbọ maka ichekwa Naijiria na-enupụ isi n'ihe ụlọikpe kpebiri bụ "iji aka akpọ nsogbu oku."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: