Ndị uweojii Anambra: A gbagbughị ụkọchukwu n'Anambra

Pastọ David Chidebere na CSP Odion Ekeinde Image copyright Anambara Police Command

Ụkọchukwu David Chidiebere nke ụka a kpọrọ 'Grace and Power Prophetic Ministry', ọ bụ anụ a na-agba egbe ọ na-ata nri?

Akụkọ na-efegharị kwuru na ndị ji egbe ji mgbọ wụgbuo ya n'ụlọụka ya dị n'Ọka, Anambara.

Mana ndị uweojii Anambra steeti kwuru na akụkọ ahụ abụghị ezie.

Ha kwuru na Chidiebere gbalahụrụ ndị ji egbe wakpoo ya ma wụọ mgbọ n'ụgbọala ya n'okporoụzọ si Enugwu gawa Udi n'Enugwu steeti.

Na mkparịtaụka BBC na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed nwere, o kwuru na a gbagbughị Pastọ Chidiebere, kama na e ji egbe gbakacha ụgbọala ya, ebe ụkọchụkwụ ahụ gbalagara na-emerụghị ahụ ọbụla.

O kwukwara na ọ bụghị n'Anambara steeti ka ndị omekeome ahụ wakporo ụkọchụkwụ ahụ, kama na ọ bụ n'okporoụzọ Udi dị n'Enugwu.

Image copyright Anambara Police Command

"Ọ bụghị eziokwu. Ihe mere bụ na n'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Septemba nke 2018, ebe Elekere Itoolu nke ụtụtụ, ndị ji egbe amaghị ndị ha bụ wakporo Onyeamụma David Chidiebere n'okporoụzọ sị Enugwu gawa Udi n'Enugwu steeti, wụọ ụgbọala ya mgbọ mana ụkọchukwụ ahụ gbalahapụrụ na-emerụghị ahụ ọbụla.

"Iji mee ka o doo ewu na ọkụkọ anya, onyeisi uweojii ogige B' Division Awka bụ CSP Odion Ekeinde, gara leta ụkọchụkwu ahụ n'ụlọụka ya bụ 'Grace and Power Prophetic Ministry' dị na State Secretariat Road, Aroma, Ọka, ebe ya na ya sere foto."

Mohammed gara n'ihu dụọ ndị mmadụ ọdụ ka ha hapụ ige ntị na kepukepu ahụ na-efegharịnụ.

O nweghị onye ma ma ndị omekeome ahụ abụ ndị ojiegbeezu ma ha abụ ndị e zigara ka ha gbagbuo ya bụ ụkọchukwu na-ewu ewu n'Ọka maka ekpere ọ na-eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara