Naịjirịa ga-azụta ihe eji enyocha ala maka alaọmajiji

Okwute Zuma

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha etinyela ego ruru nde dọla 50 a ga-eji ịzụta ngwọọrụ ga-enyere ha aka inyocha mara ihe na-eme n'ime ala nakwa ileta alaọmajijiji.

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka igwu ala a na-akpọ Nigerian Geological Survey Agency na bekee bụ Alex Nwegbu kwuru nke a n'Abuja ka ndị mmadụ kwuchara n'ala mara jiji n'Abuja ụnyaahụ.

Nwegbu bụ onye tinyere ọnụ n'okwu alaọmajijiji ahụ kwuru ka ụjọ ghara ịtụ ndị mmadụ na o nweghi ihe na-eme.

O kwuru ka alaọmajijiji ahụ mere na Mpape ghara ịmapụ ndị mmadụ obi maka na ndị ọrụ ya amalitela inyocha ebe ahụ ozugbo.

Nwegbu kọwara na ụdị ịma jijiji a emela na mba ndị ọzọ dịka Gana, Gini, Laiberia, Kameruun na ebe ndị ọzọ.

Mana ndị ọrụ ha ne-eme nyocha tọrọ atọ banyere ya bụ ihe n'ebe o mere iji mata ihe kpatara ya na ihe a ga-eme gbasara ya.

Cheta na alaọmara jiji mere n'isi ụtụtụ ụbọchị asaa nke ọnwa Sepụtemba afọ 2018 mana omebighị ihe ahụrụ anya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: