Serena Williams: Anaghị aghọ aghụghọ, kama m daa

Serena Williams

Serena Williams bụ onye mmeri a ma ama na mbaụwa n'egwuregwu tenis akatọọla onye gburu pịpịrọ n'asọmpi US Open a gbara ụnyaahụ.

Nwa Japan dị afọ 20 bụ Naomi Osaka meriri Williams n'asọmpi ahụ nke mere Osaka jiri nweta nturuugo mbụ ya a na-akpọ Grand Slam Title.

Willaims boro ogbu pịpịrọ ahụ bụ Carlos Ramos ebubo ịkpa oke n'etiti nwoke na nwaanyị ebe o kwuru na nwoke ahụ kpasoro ya ajọ agwa karịa etu o si emeso ụmụnwoke.

Mana ogbu pịpịrọ ahụ kagburu egwu William maka na ọ dara ụzọ iwu atọ nke gụnyere, ịnta enyemaka n'aka onye nkuzi ya, ịgbaji akupe egwu ya nakwa ịkpọ Ramos onye ohi.

Mana agbanyeghi ntaramahụhụ ahụ e nyere, ọ gwakwara ndị ntaakụkọ na onye ogbu pịpịrọ ahụ anaghị akpaso umunwoke ụdị agwa ahụ.

Nkọwa foto,

Serena Williams na ogbu pịpịrọ Carlos Ramos bara mba nke ukwu

N'okwu ya; "Ahụla m umunwoke ebe ha na-akpọ ndị ogbu pịpịrọ ọtụtụ afọ, anọ m ebe a alụrụ ụmụnwaanyị ọgụ.

"Naanị maka na m kpọrọ ya onye ohi mere o ji nara m otu egwu m, ahụtara m ya dịka ịkpa oke n'etiti agwa nwoke na nwanyị.

"Ọ natabeghi nwoke egwu na mbụ maka na ọ kpọrọ ya onye ohi."

Egwuregwu ahụ na-ewu ewu n'elu soshal midia maka na ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwwaanyị is ojii na-ahụa ihe mere dịka mmegbu na ịkpa oke megide ha.

Victoria Azarenka kwuru n'ezie, ọ bụrụ egwu ụmụnwoke, ihe hụ mere agaghị eme.

Mana Umar kwuru na ọ bụụ̀hị eziokwu, na etu Williams si kpaa agwa adịghị mma nke mere o ji nweta ntaramahụhụ kwesiri ya.

N'ihe niile, nke a bụ mbụ onye Japan na-enweta mmeri 'Grand Slam Title' nke Naomi Osaka dị afọ 20 nwetara dịka o meriri Serena n'asọmpi ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: