Britain: Nwafọ Naijiria eburula ọrịa 'monkeypox' gaa Lọndọn

Royal Free Hospital dị na Lọndọn Image copyright PA
Nkenke aha onyonyo Onye ọrịa ahụ na-anara ọgwụgwọ n'ụlọgwụ a kpọrọ Royal Free Hospital dị na Lọndọn

Ndị ọrụ ahụike Ingland ekwuola na otu onye Naijiria nọ n'ọnọdụ ndịagha mmiri dị na Cornwall bu ọrịa mọnkịpọks banye Briten ụbọchị Faide.

E bugara onyeọrịa ahụ na ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe na Royall Free Hospital dị na Lọndọn ụbọchị ụka.

Ndị ọkachamara n'ahụike na mba ahụ na-agba mbọ ịchọ ndị ha na nwa amadị ahụ nwere mmetụta, ndị gụnyere ndị ya na ya bakọrọ n'ụgbọelu iji nweta ozi n'aka ha ma nye ha ndụmọdụ.

Nwa amadị ahụ si Naijiria gawa Lọndọn n'abalị abụọ nke ọnwa Sepụtemba, afọ 2018.

Onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Dkta Michael Jacobs kwuru na mọnkịpọks anaghị efe efe ọsịsọ n'etiti ndị mmadụ ebe ikike ya ịba n'ime obodo dị obere.

Mọnkịpọks bụ ọrịa na-efe efe nke a na-enweta site n'anụ ọhịa bu nje ọrịa ahụ.

A na-enwetakwa ya site n'imetụ onye ọ na-arịa ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara