MTN: Anyị kpụpụrụ CBN ụlọikpe iji chekwa ego akụnaụba ndị tinyere ego na ụlọọrụ anyị

Ụlọọrụ MTN n'Abụja Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ ekwenti MTN, agala ụlọikpe inweta ikike iji kwụsị ụlọakụ etiti CBN na ọkaiwu nke gọọmenti etiti imezu ihe ha kwuru maka MTN ịkwụ ụgwọ iwu eriri ha.

N'akwụkwọ ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara n'igwe okwu Twitter ha, ụkwụ ahụ ha zọpụrụ bụ iji chekwa akụ na ikike dịrị ndị jịkọrọ aka nwere ụlọọrụ ahụ nke a na-akpọ shareholders na bekee.

Ụlọakụ etiti bụ CBN riri MTN iwu ego dị ijeri dọla 5.2 maka mbupu ego na Naijiria n'ụzọ ezighị ezi.

CBN boro MTN ebubo ibupụ ọkpụrụkpụ ego karịrị ijeri dọla 8 n'ụzọ akwụghị ọtọ ma nye ha iwu ka ha kwụghachi ya ma kwụọ ụgwọ iwu ijeri dọla 5.

Ha rikwara ụlọakụ anọ iwu maka inyere MTN aka n'ime nke a.

N'otu aka ahụ, ọkaiwu nke gọọment etiti (Attorney-General of the Federation) gwara MTN ka ha kwụọ ijeri dọla abụọ bụ ego ụtụisi ruru gọọmenti etiti.

Ha sịrị, "Nke bụ eziokwu bụ na MTN ebupughi ego ọbụla n'ụzọ megidere iwu. MTN na-agbaso iwu Naịjirịa n'ụzọ nille.

" N'ọnọdụ dịka nke a, ọ dị mkpa na agbara okwu niile n'anwụ ka o doo gọọmenti, ndị na ahazi ka ihe si aga na mgbasaozi nakwa ụlọọrụ anyị anya.

"Mana dịka ihe ndị a edoghị anya, ya mere ka anyị jiri chọ ka ụlọikpe tinye ọnụ na ya."

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara