E kwesiri inwuchi Kemi Adesoun - PDP

Kemi Adeosun Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Adeosun tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ụbọchị Sepụtemba 14

Otu pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) na Bekee akpọla oku ka gọọmenti etiti nwụchie Kemi Adesoun na-egbughi oge ọbụla.

PDP nọrọ n'akara ya na twitter taa wee kwuo na ọ bụ ezie na Adeosun ejirila aka ya tinye akwụkwọ arụkwaghị m mana o kwesiri ịga nga maka ihe o mere.

Ihe ndị ahụ ha gụpụtara gụnyere na o feghi ala nna dịka iwu nyere ma jirikwa asambodo adịgboroja iji gosi na a gafere afọ ime ya.

Ha kwuru na onyeisiala Buhari enweghi ike ịchụ Adeosun n'ọrụ garuo mgbe o jiri aka tinye akwụkwọ nke pụtara na ọ bụrụ na otinyeghi akwụkwọ ahụ, ọ kara ịnọ n'ọkwa ruo ugbua.

PDP gara n'ihu kwuo na nyocha ha na-ekwu na gọọmenti etiti chọrọ inyere Adeosun aka ka ọ ghara ịta ahụhụ njọ ya ebe ha boro ebubo na gọọmenti a na-ekpuchi ndị ọjọọ na ndị na-eme mpụ.

Ha kwukwara na gọọmenti etiti chọrọ izupu Adeosun gaa mba ofesi ebe ha kporo oku nye ndị otu mbaụwa ka ha hie asaa n'anya ịhụ na a chụlatara ya ma ọ gaa mba ofesi.

PDP kwuru na ihe ha chọrọ bụ nyocha tọrọ atọ banyere akwụkwọ niile dị n'ụlọọrụ ya oge ọ rụrụ ebe ahụ ebe ndekọ niile dị iji gosi magu magu e mere oge ọ bụ mịnịsịta.

Cheta na Kemi Adeosun tinyere akwụkwọ arụkwaghị m ụnyaa nke gọọmenti natara ka ụmụ naịjirịa tigidere mkpu maka ya ebubo megide Adeosun.

Ndị ntaakụkọ Premier Times bụ ndị mere nyocha chọpụta n'asambodo NYSC nke Adeosun ji arụ ọrụ bụ nke adịgboroja mana Adeosun ekwuola na ya amaghị na nke ahụ bụ eziokwu.

Adeosun kwuru na ọ bụ ndị ọ tụkwasịrị obi bụ ndị wetara ya akwụkwọ ahụ nke ya na-amaghị na ọ bụ nke adịgboroja rue oge akụkọ ahụ pụtara.

Mana ajụjụ ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-ajụ n'igwe soshal midia gụnyere ndị PDP bụ ma ọ ga-atakwa ahụhụ so ya bụ ihe o mere ma ọ bụrụ n'ezie o mere ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: