"Idemmiri a bụ nke kacha njọ anyị hụrụla nsonso a" - Osinbajo
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Nsogbu idemmiri
Osote onyeisiala Yemi Osinbajo agaala Anambara na Delta steeti ebe o zutere ndị okeidemmiri chụpụrụ n'ụlọ.
Osinbajo garuru Otuocha, ebe o kwuru na "idemmiri a bụ otu n'ime ndị kacha njọ anyị hụrụla nso nso a."
Dogara na PDP
Ọ bụ eziokwu na Yakubu Dogara agafeela PDP. O kwuru na ọ gara tinye akwụkwọ mmasị ya ịzọ ọchịchị.
Na mba ofesi,
Anwụchiela ndịagha anọ gbagburu nwata akwụkwọ n'isiobodo Mogadishu dị na mba Somalia.

Ebe foto si, Dahir Family
Ndị otu Amnesty International kwuru na mgbọ tụrụ nwata ahụ nọ n'ime ụgbọala bu ya na ụmụakwụkwọ ibe ya ka ndị agha ahụ bidoro gbawa egbe dịka ha na-achọ ụzọ ụgbọala ha ga-esi pụta na kpachikpachi dị n'ụzọ.
N'egwuregwu,
Amaju Pinnick meriri ntuliaka mere ya onyeisi otu NFF na Naijiria ugbua
Ebe Chelsea na PAOK Salonika na-agba egwu onye ike ga-agwụ ugbua, ebe Arsenal na Vorskla Poltava ga-azọ onye ga-emeri ibe ya dịka a na-agba Europa League na mgbede a.
Gere nkeji mgbede a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Naịjirịa
Dịka ntuliaka 2019 na-akpudebe nso, ndị ụka Kraịstị na ndị alakụba ebinyela aka n'otu akwụkwọ udo maka ọdịmma obodo.

Ebe foto si, Getty Images
Akwụkwọ udo ahụ nke otu UN na mba Amerịka so we lekọta bụ iji gosi mkpebi otu abụọ ahụ na agaghị enwe ọgbaghara dịka ntuliaka na-abịa.
Kanyị bido
N'Enugwu ebe ndị uweojii nwụchiri otu onye ụkọchukwu ndị ụka Metodist n'ebubo n'aka ya dị n'ogbugbu e gburu igwe ndị Ọgbọzinne n'Akpugo bụ Igwe Stephen Nwatu.
Cheta na dị mmadụ tigburu Igwe Nwatụ maka esemokwu dị n'etiti ya na ndị obodo ya nke e kwuru n'aka ụkọchukwu Kenneth Okafor dị ya.
Ọgbọzinne e derela dun - Ebere Amarizu
Akụkọ mba ofesi
Onyeisi mba Briten bụ Theresa May ekwuola na ya agaghị ejide Brexit ma oge ya rue.

Ebe foto si, Getty Images
Mba ahụ nwere naanị ọnwa isii iji hapụ otu EU mana enwebeghi nkwekọrịtadị n'etiti ha na ndị EU gbasara ụfọdụ ihe.
N'egwuregwu,
Taa ka a ga-ama mbe nabọ nke bụ oke dịka ndị na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'aha ịchafụ ga-eme ntuiaka onye ga-abụ onyeisi ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ya bụ ntuliaka ga-akpọtụ na Katsina taa ebe onyeisi otu ahụ Amaju Pinnick ga-azọ onye ga-achị ya afọ ọzọ na-abịa.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi