Inec chọrọ enyemaka EFCC na ntuliaka

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Inec na EFCC

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC arịọla EFCC ka ha soro lebanye anya n'akụnaụba ndị pati Naịjirịa na ndị otu ha na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ iji achụnta vootu.

Image copyright AFP

Idemmiri Anambara

Ka idemmiri na-enye ụfọdụ ndị bi n'Anambara nsogbu, kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ James Eze, kwuru na ya bụ idemmiri tara isi otu ụkọchukwu Katolik ka ọ na-achọ ịzọpụta enyi ya nwoke.

O kwuru na ihe a bụ ihe ịgba anyammiri nke ha na-agba mbọ igbochi ma na-arịọkwa ka Chukwu nyere ha aka.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Idemmiri Anambra ataala isi otu ụkọchukwu

Na mba ofesi,

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri kpuru na Tanzania arịgoola narị na iri atọ na isii.

Image copyright Stephen Msengi
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ enyemaka na-enyere aka ịkpọpụta ndị ihe metụtara

Cheta na ụbọchị 20 nke ọnwa Septemba 2018 ka e bidoro na-achọ ihe karịrị mmadụ narị ka ụgbọmmiri ahụ bu ihe ruru mmadụ narị anọ kpuru n'elu osimiri Victoria.

N'egwuregwu,

Onye egwu Man City bụ Sergio Aguero, ekwuola na obi dị ya ụtọ ịgbatịkwu afọ ole ọ ga-anọ n'otu egwuregwu ahụ.

Image copyright Getty Images

Nke a na-abịa dịka o tinyere aka n'akwụkwọ dọtịrị oge ya n'otu a ruo afọ 2021.

Naịjirịa

Onyeisiala Muhammadu Buhari emekwala Rotimi Amaechi bụ mịnịsịta okwu njem dịka onyeisi otu na-achụrụ ya nta vootu na ntuliaka 2019.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rotimi Amaechi bụ onye chigburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015

Amaechi bụkwa onyeisi mgbasaozi otu ahụ n'oge ntuliaka 2015 nke ha meriri were bata n'ọchịchị.

Ọzọ,

Ụlọọrụ na-ahụ maka ịkwụsị mgbere mmadụ bụ NAPTIP n'aha ịchafụ achụọla ụfọdụ ndị ọrụ ha na-achọ ịraba ụmụnwaanyị ndị ha napụtara ka ha na ha nwee mmekọ anụ ahụ.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa

Ha kwuru na ha chụrụ mmadụ isii ebe ha nyekwara otu onye ọzọ ezumike nka n'ike maka izupu akụkọ gbasara ụlọọrụ ahụ resaa ndị mmadụ.

Akụkọ mba ofesi

Amerịka enyela ndị agha China ntaramahụhụ maka na ha gotere ụgbọelu e ji alụ agha n'aka ndị Rọshịa.

Image copyright Getty Images

Amerịka kwuru na azụmahịa ahụ mejọrọ mmachi ha machiri Rọshịa maka ihe Rọshịa mere na Ukren nakwa itinye aka na ntuliaka Amerịka.

N'egwuregwu,

Onye nkuzi ndị Arsenal bụ Unai Emery na-achị dịka eze n'asọmpi Europa League ebe Arsenal o kpotere goolu ka akwa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Pierre-Emerick Aubameyang has now scored 21 goals in his last 25 games in European competition

Arsenal gbara otu FC Vorskla Poltava ọgbụ goolu anọ a satara abụọ ụnyaahụ n'asọmpi ahụ nyere Emery mmeri nke iri atọ na abụọ n'asọmpi Europa kamgbe ọrụ ya malitere.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIdemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.