NLC agbala isi akwara n'ịgba abụbọ ọrụ taa

Ndị otu NLC Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo NLC bụ otu jikọtara ndị ọrụ niile na Naịjirịa

Otu na-ahụ maka ndịọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' (NLC) na Bekee ekwuola na ha ga-aga abụbọ ọrụ dịka nzụkọ ha na gọọmenti amịtaghị mkpụrụ.

Nzụkọ ahụ nke mịnịsta okwu ọrụ dị n'aka bụ Chris Ngige na otu ahụ mere bụ iji lebaa anya n'okwu ego opekatampe bụ ya bụ isi sekpu ntị e ji ese okwu.

Ngige kwere nkwa na gọọmenti ga-eleba n'okwu a mana ndị NLC foro nke onyeisi ha bụ Ayuba Wabba foro ntutu taa na ha agaghị agbanwe ọnọdụ ha.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Abụbọ ọrụ na-emetụtkarị ngalaba niile n'obodo gụnyere ndị na-azụ ahịa

N'ajụjụ BBC Igbo gbara osote odeakwụkwọ ndị NLC bụ Denja Yakubu, kwuru na gọọmenti ji ụgwọ opekatampe a eme ihe ndọrọndọrọ ọchịchị kwuo na ọ bụ gọọmenti nwe ụta maka abụbọ ọrụ a ha gbara.

O kwuru na ego gọọmenti na-akwụ ndị ọrụ ugbua anaghị ezuru ha ilekọta onwe ha ma ọfọdụ zie ezinaụlọ ha anya.

N'akwụkwọ mgbasaozi otu ahụ dere nke odeakwụkwọ ha bụ Peter Ozo-Eson binyere aka, o kwuru na abụbọ ọrụ ahụ ga-amalite n'ime abalị taa bụ ụbọchị 26 Sepụtemba.

Ozo-Eson kwuru na ha nyere gọọmenti etiti izuụka abụọ iji kpokoba, hazie ma kpebie okwu gbasara iwelite ego opekata mpe a na-akwụ ndị ọrụ na Naịjrịa.

Mana dịka o si kwuo, oge ahụ ha nyere gọọmenti ga-ebi taa, nke mere na ha nyere iwu ka ndị niile so n'otu ha malite ya bụ abụbọ ọrụ.

Etu ọ dị ugbua, gọọmenti etiti emebeghi ihe ha kwuru, nke pụtara na ọ bụrụ na o nweghi ihe e mere rue n'abali taa, ya bụ abụbọ ọrụ ga-amalite n'ike na ebube.

Abụbọ ọrụ a bụ nke iji majaa gọọmenti etiti ma dọọ ha aka na ntị mana NLC ekwubeghi ụbọchị ọ ga-ebi.

Image copyright STRINGER

Kamgbe afọ gara aga, ka gọọmenti etiti kpokobara otu na-eleba anya n'iwelite ego opekata mpe a na-akwụ ndị ọrụ nke a kpọrọ 'Minimum Wage' na Bekee.

Mana dịka ha na-arụ ọrụ, mịnịsta okwu ọrụ dị n'aka bụ Chris Ngige kwuru ka ha kwụsị ka ya na gọọmenti etiti kpakọrịta mana o nwebeghi ihe ọzọ mere kamgbe ahụ.

Ndị NLC kwuru ka e welie ego ahụ site na puku naịra iri na asatọ (18.000) ọ nọ ugbua rue puku naịra iri ise na isii (56,000).

Ha kwuru na ọ bụ maka ihe isiike na Naịjirịa nakwa ego tinyere n'ihe a na-ego ihe n'ime ahịa.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a