Lee iwu CBN ise e nweghị ihe e ji ya kpọrọ

onye na-abọ ego Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye dara iwu ịbọ ego ga-ada nha N50,000 maọbụ mkpọrọ isii

Iji buo agha megide ire ego ọhụrụ, ibọ ya abọ nakwa ụzọ ndị ọzọ e ji emetọ ego Naịjirịa ụlọakụ etiti bụ CBN na-akwado ibido ụlọikpe ga na-agagharị ikpe ndị na-ere ego maọbụ ndị na-emetọ ego Naijiria.

Onyeisi ụlọakụ FSDH Merchant Bank bụ Hamda Ambah, kwupụtara nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu kwuru na CBN na ndị uweojii na Mịnịstrị na-ahụ maka ego ga-arụkọ.

N'okwu ya onyeisi mgbasaozi CBN bụ Isaac Okoroafor kọwara na iwu dịbu adị kama na ọ dị mkpa ha na ndị uweojii ijikọ aka iji hụ na a gbasoro ya.

Okorafor sị, "Nke a bụ ichetara ndị mmadụ na o megidere iwu CBN nke afọ a ire, ịbọ maọbụ ịdọka ego Naịjirịa.

Image copyright Getty Images

"A ga-eri onye mere yaa iwu dị N50,000 maọbụ tụa ya mkpọrọ ọnwa isii maọbụ mee ya ha abụọ.

"CBN nọ n'isi n'ịhụ na a agbasoro iwu ahụ n'ihi na a na-emefu nnukwu ego ibi ego ọhụrụ.

"Ọ bụrụ na ya bụ ihe bụ omenala, ọ ga-akwụsị. Ọ bụrụ omume, a ga-agbanwe ya."

Mana ọ bụghị nke mbụ CBN na-ama iwu nke ọ nweghị ihe ejiri ya kpọrọ

Lee iwu CBN enweghị ihe e ji ya kpọrọ:

1. Iwu CBN nke afọ 2007, akụkụ nke 20 na 21 machiri ịtụ mgbere ego, ịbọ ego na mmemme maọbụ ijikọ ego

Mana e nwere ọtụtụ ndị ahịa na-ere ego na enweghị mgbochi ọbụla, ebe ọtụtụ mmadụ gụnyere ndị welitere isi na-abọ ego na mmemme na enwegghị ntarahamahụhụ ọbụla.

2. Iwu CBN machiri mmadụ inye mmadụ akwụkwọ ego(cheque ) ma ego adịghị n'akpaego onye nyere ya nke a kpọrọ dud cheque na bekee

Iwu nyere mkpọrọ afọ abụọ maka onye dara iwu.

Agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị mmadụ na ụlọahịa na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ego ego adịghị, ebe ndị ụlọakụ na-agba ha ikpe ha dịka iwu siri kwuo na enweghị ntarama ahụhụ ọbụla.

Mana na nsonso, a kpụpụrụ otu nwoke ụlọikpe maka inye ego akwụkwọ ego ego adịghị na Legos.

3. Iwu machiri ụlọakụ iwepụ ego ndị mmadụ tinyere n'ọbaego n'ụzọ ekwesịghị ekwesị

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akwụ ego karịa ka ọ kwesịrị maka iwere ego n'igwe ego abụghị nke ụlọakụ gị

Iji maa atụ CBN nyere iwu ka a kwụọ N4 maka ozi ekwenti(SMS alert maka ihe ego ọbụla mmadụ mere n'akpaego ya ma nye iwu na ozi ọbụla gbasara otu ihe mmadụ mere n'akpaego ya.

Mana ọtụtụ ụlọakụ na-ezi ọtụtụ ozi ekwenti maka otu mwepụ maọbụ ntinye ego n'akpaego onye na atabighị anya ọbụla.

4. Ụfọdụ ụlọakụ na-ehinwe igwe ha ka ọ kwụ gị naanị N10,000 n'igwe ego (ATM) ka ndị mmadụ nwere na-akwụ N65 maka iwere n'igwe ego abụghị nke ụlọakụ gị

Mana o nweghị ntaramahụhụ CBN na-enye ụlọakụ ndị a ji aghụghọ anapụta ndị mmadụ ego.

Akụkọ ga-amasị gị: