Akụkọ dị mkpa: Enwe achụọla ọkwọ ụgbọala n'ọrụ

Na mba ofesi

Nkọwa foto,

Prakash bu mmadụ 30 n'ụgbọala ya mgbe enwe nyatara ya

A kwụsịla otu onye na-anya ụgbọala na mba India ọrụ ịkwọ ụgbọala makana o kwere ka enwe nyaa ụgbọala ya nke mmadụ ruru iri na atọ nọ n'ime ya.

Ntụliaka imeụlọ PDP

Nkọwa foto,

Ndị na-ere ihe gbasara Pati PDP

Ntụliaka imeụlọ PDP Ka na-aga n'ihu ebe ndị otu Pati ahụ biara ịtụ vootu edenyechala aha n'akwụkwọ ma na-eche ka ntuliaka bido.

Ihe karịrị mmadụ puku atọ ga-atụ vootu taa na ya bụ ọgbakọ ebe e nwere mmadụ iri na abụọ na-azọ oche onyeisiala n'etiti ha.

Onye Igbo ga-anọchite ndị bi na Lagos

Nkọwa foto,

Jude Idimogu nọbụ na pati PDP

Onye Igbo azọtala ohere ị nọchite anya ndị bi n'Isolo /Mushin dị na Lagos steeti.

Aha ya bụ Jude Emeka Idimogu. O si na PDP fee na pati APC.

N'egwuregwu,

Nkọwa foto,

Achụpụla Jose Mourinho n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England

Ndị otu Man. Utd ekwuola na-asịrị na-agagharị na aga achụ onyeisi ha bụ Jose Mourinho n'ọrụ dịka okwu na-enweghị isi.

Okwu a bidoro kamgbe otu Manchester United dachara na mbido egwuregwu agba ọhụrụ Premiere league.

Gere akụkọ mere na mgbede a na nkeji:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo,

Ọ bụdị nkafie bụ ịkpere chukwu n'ụzọ omenala?