Mmachi njem: Buhari nupuru isi n'iwu na mkpebi a - ọkaiwu Nnaji
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ihe ndị Nigeria na-ekwu maka mmachi njem mmadụ 50

N'ime mkparita ụka BBC Igbo na ọkaiwu Chima Nnaji nwere maka ịchọpụta ma iwu Naịjirịa ọ ga-akwado mkpebi a pụtara n'ọnụ onyeisiala Naịjirịa maka mmachi amachiri mmadụ 50 ịhapụ Naijiria ga mba ọzọ.

Chima kowara na iwu Naijiria akwadoghị ihe a Buhari mere.

Biko gee ya n'uju n'isi mbido akụkọ a.

N'elu social media, ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ekwukwa uche ha gbasara mkpebi.

Ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ihe a abughị ihe mkpa Naịjirịa ugbua.

@obetodennis dere na oweghị ihe mkpebi a pụtara makana ndị a niile aha ha pụtara ka nọ n'ụlọikpe maka ebubo dị ha n'ishi nakwa na ụlọikpe akpachiela akwụkwọ njem ha.

@BCalamansi gbara ajụjụ nke ya na ọ bụ ka gọọmentị a ga-ebuso mpu na aghụghọ agha? makana ọ nwere ọtụtụ aha n'uche ya kwesiri ịpụta na yabụ akwụkwọ.

@O13Update dere na o nweghị olileanya ya nwere maka gọọmenti ọbụla Naịjịrịa

Mana @OdeyphilA dere na ndị na achọghị ikwado mkpebi a pụtara n'aka Buhari bụ ndị na-akwado mpu na aghụghọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị