Shehu Sani: Gịnị na-akpọtụ na APC?

Akụkọ dị mkpa taa

Shehu Sani

Ebe foto si, Senator Shehu Sani/Instagram

Akụkọ na-ewu n'ụlọ ntaakụkọ dị icheiche bụ na Shehu Sani bụ sinetọ ama ama na Kaduna steeti esila na APC pụọ.

O nwere akwụkwọ ozi a na-ekwu na o si n'aka onye enyemaka ya pụta na-efegharị kwa ugbua.

Mana Sani n'onwe ya apụtabeghị ịgọ maọbụ ịkwere ihe ọbụla.

Ọzọ,

Nnamdi Kanu na ndị mmadụ

Ebe foto si, Elliot Ugochukwu-Ukoh

Onye ọkaiwu nọchitere anya Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ndịagha Naịjirịa ga-azara ọnụ ha n'ihe gbasara ntọrọ na mkpachị Nnamdi Kanu onye aha na-ewu kemgbe ihe onyonyo pụtara gosiri ebe ọ na-ekpe ekpere na Jerusalem.

Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC ekwuola na ha agwaala aka chịburu Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose iwu o megidere nakwa ebe a ga-anọ kpee ikpe ya.

Cheta na Fayose kpụgara onwe ya n'ụlọọrụ n'abalị ole na ole gara aga.

Na mba ofesi

Jamal Khashoggi

Ebe foto si, Getty Images

Mba Turkey ekwuola na ha ga-ewepụta ihe akaebe iji gosi na ọ bụ ala Saudi Arabia gburu Jahmal Khasoggi ebe Saudi Arabia n'onwe ha kwetara na Khasoggi nwụrụ n'ezie mana ọ bụ mgbe a na-alụ ọgụ ka ọ nwụrụ.

N'Egwuregwu

Asọmpị Chelsea na Man U ebirila ọkụ na soshal midia agbaneyghi na otu abụọ ndị a gbara onwe ha onyelaba onye laba.

Murinho n'onwe ya na-ewu maka ọgụ ọ chọrọ ị manye mmadụ n'ogbo egwuregwu ahụ.

Gee Nkeji nke mgbede a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ohaneze adọọla IPOB aka na nti

Nnia Nwodo

Ebe foto si, OHANEZE NDIGBO FACEBOOK PAGE

Nkọwa foto,

Ohaneze ndị Igbo na Ipob nwere nnukwu nsogbu maka ebe Nnamdi Kanu nọ kamgbe.

Ohaneze ndị Igbo site n'ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Uche Achi-Okpaga ekwuola na etu esi hụ Nnamdi Kanu n'onyoonyo gosiri na ọ nọ na ala Isreal bụ ezigbo ihe a ga-eji nye Chukwu ekele.

Ha na-ayọkwa ka ndị otu IPOB gbaara ihe ọ bụla ga-eme ka ha na ndị agha Naijirịa kwatụọ nke ga-enye ha ohere ị were egbe na-agba ha

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere IPOB kwuru na obi bụ ndị otu Ipob sọ ọṅụ maka etu ha si mata na onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu ka dị ndụ.

Ndị azụmahịa Naịjirịa nọ na Ghana chọrọ enyemaka

Ahịa Makola na mba Ghana

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ngalaba jikọtara ndị Naịjịrịa na-azụ ahịa na Ghana bụ Chukweuemeka Nnaji akpọkuola gọọmentị etiti Naịjirịa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka nsogbu dị n'etiti ha na ndị "Ghana Union of Traders

Association" nakwa ndị uweojii na -ahụ maka azụmahịa n'obodo ahụ nke kpatara na ha aghaghị emepe ụlọ ahịa ha ruo oge a na amabeghị.

Ha chọghị ka okwu a banye ihe ọzọ.

N'ofesi,

Mohammed Dewji

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Dewji bụ ọkaachasị nwe ego ruru ijeri ijeri dọla

Achọtala onye ọkachasị nwe ego dika ntorobia na Tanzania bụ Mohammed Dewji.

Ndị tọrọ Dewji kamgbe ụbọchị ruru iri n'ọnụ ọgụ.

Dewji depụtara n'akara twiutter ya na ndị ntọ hapụrụ ya n'udo.

Mana a amabegị ma ndị be ya akwụrụ ego ọ bụla.

Mourinho na-arọ Eden Hazard anya

Hazard na Mourinho

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto,

Hazard meriri egwuregwu Premier league mgbe Mourinho na-achị Chelsea n'afọ 2015

N'egwuregwu, Mourinho bụ onyeisi Manchester united na-arọ Eden Hazard onye otu Chelsea anya mana ọ ma na ọ gaghị emeli ihe dị na ya makana ndị na-achị Chelsea wara ezigbo anya.

Ha agaghị ekwe resi Man U Hazard.

Obi adịghị ndị ọrụ ahụike mma

Ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Getty Images

Otu jịkọtara ndị ọrụ ahụike nọọsụ na ndị na-amụ nwa na mpaghara ugwu eyiela egwu na ha ga-akwụsị ịrụ ọrụ maka ogbugbu Boko Haram na-egbu ndị otu ha.

Onyeisi otu ahụ bụ Abdulrafiu Adeniji gbarụrụ ihe n'ụdị aka gọọmentị etiti ji echekwa ndị ọrụ ahụike n'ogbe ahụ.

Nnamdi Kanu ọ pụtala?

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Elliot Ugochukwu-Ukoh

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi na onye ndu Otu IPOB bụ Nnamdi Kanu ebe ọ na-ekpe ekpere n'ụlọụka ndị Juu dị na mba Izreal.

Onye ndụ otu Igbo Youth Movement Elliot Ugochukwu Ukoh gwara BBC Igbo na onyonyo ahụ bụ nke ezi ya na Nnamdị ga-ekwu okwu oge na-adịghị anya.

Mberede Ụgbọoloko

Ndị merụrụ ahụ na mberede ụgbọoloko

Ebe foto si, EPA

Ụgbọoloko akwụriela ihe karịrị mmadụ iri ise ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ dịka ọsọbara ihe n'ebe igwe mmadụ na-ekiri emume Hindu na mba India.

Anya hụrụ dịka ihe a ji mee gwara BBC na ndị a kwụ n'ahịrị okporo ụgbọoloko ahụ ma ha amaghị mgbe o ji rute ha nso.

N'egwuregwu

Karim Benzema

Ebe foto si, Getty Images

Onye na-agbara Real Madrid bọọlụ bụ Karim Benzema agọlarịala akụkọ na-ekwu na o so ndị chọrọ ịtọọrọ otu nwoke ji ya ụgwọ.

Benzema kwuru ka a hapụ ya ka ọ ṅụrụ mmiri tọgbọ Iko.

Nkeji nke abalịa

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa

Aha onyonyo,

Onye na-akọ osikapa Abakaliki