New Minimum Wage: Anyi agaghị akwụlị ego opekatampe ndị ọrụ

NGF
Nkenke aha onyonyo Nigeria Governors' Forum bụ otu jikọtara gọvanọ niiloe na-achị steeti 36 di na Naijirịa

Ọ dikwa ka ndị ọrụ agaghị ekweta nke a makana ndị gọvanọ ekwupụtala na ha agaghị akwụlị ego opekatampe e wepụtara ọhụrụ.

Cheta na mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige gwara ndị ntaakụkọ n'izu uka garaaga na ndị otu ọrụ na-ekwu ka e nye ha puku naira iri atọ kwa ọnwa.

Image copyright STRINGER

Mana gọọmentị kwuru na ha ga-enye ha puku naira iri abụọ na anọ ebe ndị gọvanọ na-ekwu na ha ga-akwụli naani puku naira abụọ.

Mana ka ọ dị ugbua, amabeghị ma ndị ọchịchị otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa a ga-anabata puku naira iri abụọ na anọ nke ndị ụfọdụ na gọọmentị kwekọrịtara.

Ihe nke a pụtara bụ na ndị otu NLC akpọọla oku ka ha nwe nzụkọ maka mkpebi ihe ha ga-eme.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ Naijirịa na-ejị May 1 eme emume mba ụwa niile ji echeta ha.

Onyeisi NGF ma bụrụkwa aka na-achị Zamfara steeti kwuru na ndị gọvanọ na onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba nwere mkparita ụka ebe ọ gwara ha steeti ole na ole kwekọrịtara ikwụcha ụgwọ niile ha ji ndị ọrụ steeti ahụ.

Mana otu a kpọrọ "National Economic Council (NEC)" zụkọrọ ụnyaahụ mana ha akapaghị maka ya bụ mbugo ego ndị ọrụ.

Gọọmentị etiti ekwetaghị na ha ga-akwụ puku naira iri atọ dika ego opekatampe.

Ndị ọrụ jụkwara nke ha kwetere ịkwụ. Ndị gọvanọ kwukwara nke ha.

Ihe ndị mmadụ chọrọ ịma ugbua bụ kedụ nke ndị ọrụ ga-ewe?

Cheta na ọ bụ ego ruru naira puku iri ise ka NLC na-ekwu ka a kwụọ ha nke mere ha ji gwa ndị ọrụ ka ha agba abụbụ ọrụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a