Anambra: Willie Obiano a gaala ikele ọyị ya bụ Ooni Ife

Ooni/Obiano Image copyright Ooni's Palace
Nkenke aha onyonyo Obiano kelere Ooni maka ịhụnanya o na-egosi ndị be ya nakwa ndị Anambra

Gọvanọ wiilie Obiano nke Anambra steeti agaala Ife ị kele ọyị ya nwoke bụ Eze ha maka nwunye ọhụrụ ọ nụrụ.

Obiano kwuru na ọbịara ị kele Ooni Ife bụ Arole Oduduwa, Ooni Adeyeye Enitan Ogunwusi, Ojaja II na nwunye ya bụ Olori Silekunola Naomi Ogunwusi(Yeyeluwa) maka ịhụnanya ya na ndị be ya na-egosi ndị

Anambra steeti na Ezinụlọ ya.

Image copyright Ooni's Palace
Nkenke aha onyonyo Ooni kwuru na ha maghị na Chukwu ga-ebuli ha elu ruo ebe ha nọ ugbua

Obiano kpere Eze Ife ekpere ma gozikwa ha.

Ooni Ife kelere Obiano onye ọ kọwara dịka ezi enyi kamgbe maka ịhụnanya na nkwanye ugwu o nwere na ebe oche eze Oduduwa nọ nakwa ndị ọchịchị omenaala nọ na Naịjirịa.

Image copyright Ooni's Palace
Nkenke aha onyonyo Obiano kwuru na Ife bụ nna ndị Yoruba niile nọ ebe niile n'ụwa

Ooni gwara ya na mgbe ha bidochara ọyị ha, ha maghị na Chukwu ga-ebuli ha elu ruo ebe ha nọ ugbua.

Ọ gwara Obiano na obi dị ya utọ etu o si emeta ndị Anambra steeti ọfụma.

Image copyright Ooni's Palace
Nkenke aha onyonyo Ooni Ife kwuru na Obiaano bụ ezigbo ọyị ya kamgbe

Ooni gwara onye ọbụla n'ogige ya ka ha kulie ọtọ kwanyere Obiano ugwu maka ezigbo ọchịchị na agwa ziri ezi Obiano na-egosi kamgbe o bidoro chịwa steeti ahụ.

Ọrịọrọ ya ka ọ ghara ị da mba n'iwulite Anambra steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara