Nnamdi Kanu: Abaribe na Fani-Kayode ga-agwa anyị ka o si gbapụ na Naịjirịa - Ọkaiwu

Ndị gbara Nnamdi Kanu akaebe Image copyright BBC/ElliotUkoh/@realFFK

E depụtala akwụkwọ ikpe n'ụlọikpe dị n'Abuja ga-ahụ na enyochara ma nwụchie ndị dịka onye bụbụ Minista na-ahụ maka ụgboelu bụ Femi Fani-Kayode nakwa Sinetọ Enyinnaya Abaribe na ndị ọzọ.

Onye depụtara ya bụ akwụkwọ ikpe bụ Isaiah Ayugu, nke kọwara onwe ya dịka ọkaiwu na-akwụ ụtụ isi ya na Naịjirịa.

Ayugu kwuru na ọ bụ maka na Nnamdi Kanu gbapụrụ na Naịjirịa kpatara ikpe ebubo ịmegide ala Naịjiria ji ka kwụrụ na-emetụghị aka n'ihu ọkaikpe ndị ụlọikpe gọọmenti etiti bụ Binta Nyako.

O kwuru na asị niile na ebubo a na-ebo ndị agha Naịjịrịa na ha gburu ma tọrọkwa Namdi Kanu na-eme ya ezigbo ihere.

O boro Fani-Kayode ebubo na o kwuru na ọ tụrụ asị gbasara ikpe ahụ nke butere ngbapụ Nnamdi Kanu na Naijirịa.

Ọ bụghị nani Fani-Kayode ka o na-atụ aka ka a nwụchie, ndị ọzọ gụnyere Abaribe, Tochukwu Uchendu nakwa Emmanuel Shallom Ben bụ ndị gbaara Nnamdi Kanu aka ebe mgbe ụlọikpe tọghapụrụ ya n'ọnwa Epreelụ nke afọ 2017.

Ndị ọzọ gụnyere ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor nakwa ndị be onyeisi IPOB bụ Emmanuel na Uchechi Kanu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a