Nkwado Ndigbo: Peter Obi asaala Oshiomhole

Image copyright AFP

Peter Obi sị na Oshiomhole tụrụ asị

Peter Obi ekwuola na okwu onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole kwuru na na ndigbo anabataghị ya dịka onye ga-esote Atiku Abụbakar n ọsọ ndọrọndọro ọkwa onyeisiala nke PDP na 2019 bụ ụgha.

Obi, onye kwuru nke site n'onu ojeozi mgbasaozi ya bụ Valentine Obienyem kwuru na naani nsogbu e nweburu bụ a kpaghị ụka ahụ akpa.

Ụlọikpe ukwu atụufiola akwụkwọ ndị otu ụmụnwoke na-alụ onye ha

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụlọikpe ukwu na Naịjirịa

Ulọikpe ukwu atụpụla akwụkwọ ndị otu chọrọ ka nwoke lụwa ibe ya maọbụ nwaanyị lụwa ibe ya ha gbara Corporate Affairs Commission bụ ngalaba gọọmenti na-edebe aha ụlọọrụ dị na Naịjirịa.

Ụlọọrụ CAC jụrụ ịdebe aha ndị otu a dịka otu tozuru ịrụ ọrụ na Naịjirịa.

Emmanuel Macron akpọọla oku ka mba dị dị n'Uropu jikọọ ọnụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Emmanuel Macron bụ Onyeisiala mba France

N'ofesi, Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron akpọọla oku ka otu jikọtara mba Urope gbaa mbọ jikọọ ọnụ maka igbochi ọgbaaghara n'ụwa.

Macron kwuru nke a na Berlin mgbe ọ gara emume maka ncheta ndị e gburu n'agha.

N'egwuruegwu

Image copyright NFF/Twitter
Nkenke aha onyonyo Saụt Afrịka gbara Super Falcons 1 - 0 na Ghana

Gee nkeji ụtụtụ a ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị n'ụtụtụ a

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a