Corpus Christi: Ka emume #Christtheking siri kpọtụọ n'Enugu

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgwe mmadụ apụtala maka Oriri Kristi bụ Eze n'Enugwu

Oriri Kristi bụ Eze (Christ the King) bụ nke ndị ụka Katọlịkị na-eme otu ụka n'afọ iji were gosipụta na Jesọs Kraistị bụ Eze n'ezie.Oriri a bụ nke a na-eme na ụka ikpeazụ na kalenda nke ụka.

Ihe nke a pụtara bụ na tata bụ ụka ikpeazụ tupu abanye oge Adventi.

N'Enugwu ya bụ mmemme na-ekpo ọkụ site na parish dị iche iche ịkwụ n' ahịrị n' ahịrị na-ekpe ekpere, agba egwu, were na eto Kristi bụ eze.

Ọtụtụ parishị dịka Holy Ghost Cathedral Enugwu, St Michael's Asata, Blessed Sacrament Parish, St Mulumba New Haven Enugwu na ọtụtụ ndị ọzọ pụtara n' igwe gagharịa n'okporoụzọ dịga n' Enugwu.Onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye ụka Katọliki na-egosiputa otu ọ nọ n'ụka tata site na isoro ndị otu ya na- agbara Kraistị egwu.

Oriri Corpus Christi(Body of Christ/#Christtheking) gbadoro ụkwụ na akwụkwọ nsọ oge Jesọs sara pilate ajụjụ sị " n' ezie a bụ m eze" Mmemme Kristi bụ Eze gasia tata, ụka na- abịa, ụka ga-amalite Adventi iji kwadebe maka ọmụmụ onye nzọpụta Jeso Christi.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a