Chizea: Ọdịda ọnụ mmanụ agbịdị ga-ebute ụbịam

ite mmanụ agbịdị Image copyright Getty Images

Ahụ ọma jiji ji ndị ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo dịka ọnụ mmanụ agbadị sitere n'ihe karịrị dọla 86 datuo rue dọla 58 maka otu udu mmanụ n'ahịa mbaụwa.

Cheta na ndị na-ahazi ọchịchị Naịjirịa nke a kpọrọ 'Federal Executive Council' na bekee gbadoro ụkwụ n'ọnụ mmanụ ịda dọla 60 were hibe bọjet afọ 2018.

Ọ bụrụ na ego mmanụ erughị otu a, ndị ọkammụta na-ekwu na ọ ga-eme ka nsogbu ihe isi ike, ụbịam na enweghị ọrụ bawanye.

Onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnaụba bụ Boniface Chizea kọwara n'ihe ọdịda ọnụ mmanụ pụtara ụmụ Naijiria bụ na ihe ga-ebido siwanye ike.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChizea: Ọdịda ọnụ mmanụ ga-ebute ụbịam

Ego aga-eji mezuo bọjeti agbalite

Chizea kwuru na mmanụ daa, ihe ọ pụtara bụ n'ego Naịjirịa na-enweta n'ire mmanụ ga-agbada nke na gọọmenti agaghị enwe ike imezu ihe ndị ha hibere ime na bọjeti.

"Ego a na-ereta na mmanụ datuo, o metụta bọjeti. Ị ga achọkwụ ego a ga-eji gbachi."

ga-ebute ụbịam.

Chizea kwukwara na "ego a na-ebite bụ nke a ga-eji kwụọ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ, kwụọ ụgwọ e ji egote mmanụ, a gaghị etinye ego n'ikwalite obodo site n'ịrụ ọrụ na-ewulite nke ga-eme ka ụbịama na-abawanye.

Na nkọwa ya, ọ bụrụ na ị na-ebite ego ka i were rie erie, "ọ bụrụ na nsogbu dị."

Naịjirịa ekwesighị ị na-atụbata mmanụ

Chizea kọwara na ọnụ mmanu gbaliteburu n'ihi nsogbu dị n'etiti mba Amerịka na Iran n'ihe gbasara okwu ngwaagha nuklia.

Ọ rụtụrụ aka n'ego mmanụ agbalitere ma ọ gbaturu bụ nsogbu nye Naijiria n'ihi na Naijiria bụ obodo na-egwupụta mmanụ ma na atụbatakwa nke ha ji eme ihe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: