Ipob: Ndị uweojii asaala ndị na-ebo ha ebubo aghụghọ

IPOB na Uweojii Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii nọ n'Anambara kwuru na ndị otu IPOB ji mma merụọ ndị otu ha ahụ

Ndị uweojii Anambara steeti akwala ndị mmadụ ka ha wetara ha ozi ndị Ipob kpara mkpamkpa na Nnewi ụbọchị Fraide gara aga.

Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed nwere n'ekwenti o kwuru na ndị na-ekwu na ọ bụghị ndị mere ihe ka ndị uweojii nwụchịị gosiri na ha mara ndị mere ihe ndị ahụ n'ezie.

""Ị sị na ọbụghị ndị mere ihe ka a nwụchiri, nke a pụtara na ị ma ndị mere ya n'ezie., ya bụ pụta bịa gwa ndị uweojii ndị mere ya n'ezie."

Cheta na isi ụlọ ọrụ ndị uweojii n'Abuja wepụtara aha mmadụ 33 bụ ndị a na-ebo ebubo na ha bụ ndị Ipob mere ngagharịiwe ebe ha gburu otu onye uweojii, ma merụkwa onyeisi ndị uweojii ahụ ma gbaa ụgbọala ha ọkụ.

N'akwụkwọ mgbasaozi nke ha wepụtara n'ụtụtụ Monde, Nọvemba 26, ndị uweojii kwuru na otu Ipob bụ otu a mabidoro n'iwu dịka otu ndị na-eyi ndụ egwu nke a kpọrọ "Terrorist Group" na Bekee.

Ha kwukwara na ndị Ipob merụrụ "onyeisi ndị uweojii(DPO) ogige Central Police Station (CPS), Nnewi bụ CSP Babalola Adewunyi, ASP Micheal Duru nke 'Area Command, Nnewi' nakwa Inspector Akinbami Olaniyi nke CPS Nnewi ahụ.

"E bugara ndị uweojii ahụ merụrụ ahụ ụlọọgwụ maka nleta mana Inspektọ mechara nwụọ ebe dị ogbo ya ka na-anata nleta n'ụlọọgwụ."

Ndi uweojii kwuru na ha nwetara ọgbatumtum asatọ, ọkọlọtọ Ipob ise nakwa okpu Ipob ise dịka ihe akaebe.

Ha boro ndị Ipob ebubo iji ngwaọgụ dị egwu gbakọọ na nsonso ụlọọgwụ nkuzi dị n'ụzọ Owere, iji bute ọgbaghara.

Ha kwuru na ngwa ngwa ndị uweojii ji bịa gbara mbọ iji gbochie ha ibute ọgbaghara, ebe ha gburu otu onye otu ha, merụọ abụọ ahụ ma sunye ụgbọala ha ọkụ.

Ndị uweojii bokwara otu Ipob ebubo ịnapụ ha egbe ike nke a kpọrọ AK-47 nakwa nke obere a kpọrọ "Beretta" na mgbọegbe.

Ha kwuru na ndị Ipob jiri mma na ngwaọgụ ndị ọzọ wee wakpokwa ndị mmadụ, na-eti "No Election without Referedum".

Lee aha ndị ha wepụtara:

  1. UCHE AMOS, onye dị afọ 65, onye Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  2. ELIAZER EMMANUEL, onye dị afọ 24, onye Umunneochi, Abịa Steeti
  3. ELIAZER CHIMA, onye dị afọ 23, onye Umunneochi, Abịa Steeti
  4. ABUCHI OBETA, onye dị afọ 19, onye Nnewi Saụt, Anambara Steeti
  5. SOMTOCHUKWU OKAFOR, onye dị afọ 17, onye Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  6. AGBOMA JUDE, onye dị afọ 35, onye Nsukka, Enugwu Steeti
  7. EZEZONA ODUAGU
  8. KELECHI EZE, onye dị afọ 20, onye Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  9. OKAFOR CHIMIERE OLISA, onye dị afọ 20, onye Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  10. RAPHEAL OGOH, onye dị afọ 27, si Nnewi Saụt, Anambara Steeti
  11. OKEKE CHISOM, onye dị afọ 19, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  12. DANIEL NWAKPU, onye dị afọ 35, si Ikwo, Ebonyi Steeti
  13. FRIDAY NWAFOR, onye dị afọ 34, si Ishielu, Ebonyi Steeti
  14. ONYEKA NWAJOBI, onye dị afọ 49, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  15. OBETA UWAKWE, onye dị afọ 25, Igboeze Nọt, Anambara Steeti
  16. FESTUS ODIKA, onye dị afọ 41, Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  17. EMMANUEL OKOYE, onye dị afọ 22, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  18. UMEH SUNDAY, onye dị afọ 43, si Aguata, Anambara Steeti
  19. IKE CHIEMEZIE SAMUEL
  20. SUNDAY ILONZE, onye dị afọ 43, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  21. CHUKWUEMEKA NWAESE, onye dị afọ 32, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  22. ODUGU CHIMA, onye dị afọ 23, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  23. JACOB MONDAY,onye dị afọ 48, si Nnewi Saụt, Anambara Steeti
  24. VINCENT OKOROAFOR, onye dị afọ 39, onye Owere-Nọt, Imo Steeti
  25. JUDE EKE, onye dị afọ 32, si Igboeze Saụt, Enugwu Steeti
  26. CHARLES UKAZU, onye dị afọ 35, si Ideato Saụt, Imo Steeti
  27. EZIOKWU ERNEST onye dị afọ 17, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  28. CHIBUIKE OZOEMENA, onye dị afọ 30, si Ikeduru, Imo Steeti
  29. CHIGOZIE ONYEOGAZIRI, onye dị afọ 46, si Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  30. NWANKWO DONATUS, onye dị afọ 48, si Orumba Saụt, Anambara Steeti
  31. OKAFOR OLISA, onye dị afọ 20, onye Nnewi Nọt, Anambara Steeti
  32. PETER NWANKWO, onye dị afọ 25, Nnewi Saụt, Anambara Steeti
  33. EBEGBONI GEOFFREY, onye dị afọ 43, si Ika Saụt, Delta Steeti

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a