Nigeria Election 2019: Achịcha na onyinye ndị ọzọ e ji arịọ maka vootu gị

Achịcha Image copyright @Olurops/Twitter
Nkenke aha onyonyo Ihe oriri anaghị akọ n'onyinye ndị ndọrọndọrọ ji arịọ vootu

Oge onyinye ọkụkọ, achịcha, mkpọ machis, ncha, akpa osikapa na mmanụ nri oruola ọzo?

Onye ọbụla maara na Naịjirịa na-akwado maka ntuliaka 2019 ga-ebido na Febụwarị 23.

Oge ntuliaka na Naịjirịa bụ oge ndị na-azọ ọkwa ọchịchị n'okpuru pati dị iche iche na-enye onyinye ka o si masị ha.

Dịka ị ga-achọpụta n'ime akụkọ a, ụfọdụ onyinye a nwere ike ịgbagwoju gị anya nakwa bute ọchị maọbụ nnukwu iwe n'obi gị.

Lee onyinye ise pụrụiche ndị na-azọ ọkwa ọchịchị nyere ndị na-akwado ha n'ime ntuliaka gara aga na Naịjirịa.

Achịcha (Bread)

Oluwarotimi Akeredolu bụ gọvanọ Ondo steeti bụ onye foto ya dị n'elu achịcha a.

N'ahịa, a na-ere ụdịrị achịcha a otu narị naira (N100); ike ka ọ ga-eji ju gị afọ ma ọ bụrụ na ị bụ nwoke.

Mana ọ bụ ihe ndị Naịjirịa bi n'Ondo steeti hụrụ dịka onyinye ibinyere otu APC aka na ntuliaka e ji họpụta gọvanọ steeti ahụ na Nọvemba 2016.

Igwe mmadụ natara achịcha a n'agbanyeghị na onweghi onye maara n'ezie onye bidoro inye ya bụ onyinye.

Oluwarotimi Akeredolu mechara merie ma bụrụ gọvanọ.

Nri 'Indomie'

Nke a mere n'Anambra steeti na ntuliaka gọvanọ nke afọ 2013.

Otu "All Progressive Grand Aliance (APGA)" mechara merie na ngwụcha ntuliaka a.

Nke a bụkwa ọzọ mere n'ọnwa Maachị n'afọ 2015 na ntuliaka ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

‏@Hitee_ kọwara na ọ bụ ndị otu PDP mabanyere nri a n'ime ụgbọala ya na Legọs.

Baro (Wheelbarrow)

Nke a malitere na Benue steeti.

Dịka egwuregwu, ndị Benue steeti n'afọ 2017, nụrụ na gọvanọ ha bụ Samuel Ortom na-ekesa baro dịka ọpụpa na steeti ahụ.

Nke a butere nnukwu ọchị n'elu soshal midia.

Mana Ortom kwuru na onyinye baro a bụ maka ikwado ndị ntorobia na steeti ahụ.

Mana ndị mmadụ ekwetaghị na nke a, ha na-ekwu na ọ bụ maka Ortom chọrọ iso n'ọsọ ntuliaka 2019 dịka gọvanọ steeti ahụ.

Igwe okwu (radio)

Shehu Sani bụ sinetọ na-anọchite anya Kaduna sentral n'okpuru otu APC.

Onweghi onye maara n'ezie oge e setere foto a, mana akụkọ pụtara na soshal midia mgbe ahụ kọwara na oteghi aka Ortom bidoro ikesara baro, ka Sani bidoro ikesa igwe okwu nke ya.

Dịka onyinye ndị ọzọ, nke a bụtere nnukwu ọchị n'elu soshal midia.

Akwụkwọ e ji etinye ego n'ekwentị (recharge cards)

Onyinye a malitere na Legọs ma bụrụkwa nke a kachasị kesaa dịka onyinye ịrịọ maka ịtụ vootu.

Na Legọs n'afọ ahụ, ọtụtu mmadụ kwetere na ha natara onyinye a.

Ka a tụchara ntuliaka ahụ, APC bụ ndị nwetara mmeri.

Akụkọ ga-amasị gị: