NPC ka na-ana ego asambodo nwa ọhụrụ

NPC ka na ana ego asambodo nwa ọhụr

Nwa ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Ka ọ gachara ihe karịrị awa 24 ụlọomeiswwu nta machiri ya, ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ nke a kpọrọ 'National Population Commission' na bekee ka na-ana ego maka asambodo ọmụmụ nwa.

Omeiwu Nkeiruka Onyejeocha onye kwulitere okwu a n'ụlọomewu kwuru na ịna ego maka asambodo ọmụmụ nwa na-eme ka ndị bi n'ime obodo hapụ idenye aha nwa ha n'akwụkwọ.

A na ana ndị nwa ọhụrụ ha erubeghị ọnwa atọ narị Naira ise, ebe ndị karịrị nwere ike ịkwụ puku naira anọ.

Gọọmentị Abịa azachiela Alex Otti

Ebe foto si, John Okiyi

Nkọwa foto,

John Okiyi Kọmishọna mgbasaozi, Abia Steeti

Gọọmentị Abịa steeti azachiela Alex Otti bụ onye ji ọkọrọtọ APGA azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na okwu ya na ya ga-enyocha nrụrụaka mere n'oge ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu ma ya banye n'ọchịchị.

Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ John Okiyi gwara Alex Otti na egwu nyocha anaghị atụ Ikpeazụ, kama Otti buru ụzọ nyocha ije ya na ndị chịrịla steeti ahụ oge gara aga.

Sineti ekwenyele na South East Dev. Commission Bill

Ebe foto si, NASS

Ụlọomeiwu ukwu etinyele aka nkwado n'akwụkwọ iwu maka imepe South East Development Commission bụ kọmishọn nke ga-ahụ maka mmepe na steeti ise dị n'Alaigbo.

Enyinnaya Abaribe bụ otu n'ime ndị kwadoro ya bụ akwụkwọ na sineti sị na ya bụ kọmishọn ga-ehiche Igbo anya mmiri kemgbe agha.

China ejidela onye Kanada ọzọ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Michael Spavor (Akaegbe), Michael Koving bú ndí Kanada ndí Chaína ji

Ka na-ekwu ka a na ekwu o, na mba China a kpọchiela onye Kanada ọzọ bụ onye China boro na o mebiri iwu nchekwa obodo ha.

Michael Spavor bụ onyejiegoachụego e jidere ụbọchị Tọzde mere ya onye nke abụọ nọ na mkpọrọ na mba China bụ nke mere na mba abụọ a ejighị ezigbo anya ele onwe ha.

Amachiela igosi mgbasaozi ịgba chachacha

N'egwuruegwu, Na mba Briten a mechiela igosi mgbasaozi ịgba chachacha oge ana-egosi asọmpi egwuregwu bọọlụ.

Ndị otu ụlọọrụ na-agba chacha kpọrọ onwe ha, 'Industry Group for Responsible Gambling' sị na nke a ga-ebido ị dị ire n'afọ 2019.

Akụkọ ga-amasị gị

Gee nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri

Aha onyonyo,

Kingsley na-akpa isi