Second Niger Bridge: Ọgbanje na-ekulite n'ọnwụ kwa afọ anọ?

Akwa Naija
Nkenke aha onyonyo Ọrụ Akwa Naịja nke abụọ ka nọ n'isi mbido

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'alaigbo ekwuola na akwa Naija nke abụọ aghọọla ọnya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji amata Ndigbo oge ntuliaka ọbụla tụnyere n'ụkwụ.

Okwu a na-apụta dịka ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari malitere ọrụ ọzọ n'akwa ahụ ma mekwa ya okwu akpụ n'ọnụ ugbua.

Na nso nso, kọmịti ụlọomeiwu Naịjirịa nke ihe gbasara nyocha ka esi arụ ọrụ n'okporoụzọ gọọmentị etiti gara leta ka ọrụ sị aga n' akwa Naija nke abụọ ma gwa ndị ọrụ ka ha rụcha ya ọsọ ọsọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'E ji akwa Naija nke abụọ egwu Ndigbo chandum'

Mana otu onye Igbo ọnụ na erụ na okwu bụ Harry Oguego si na "akwa Naija nke abụọ dịzị ka nkwa e kwere nwaanyị, anaghị emezụya emezu."

Oguego,onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị (political analyst), gara n'ihu kwuo na oge ọbụla oge ntuliaka ruru, ndị ọchịchị na-aga n'Akwa Naija nke Abụọ "kpọcha ala, bugharịe igwe e ji arụ ọrụ, mee mkpọtụ, ka ọ dị ka o nwere ihe a na-arụ."

"Ha asị anyị tinye akwụkwọ ka ha nwe ike ịrụtọpụ akwa Naija, a tụnyere ha akwụkwọ, ha banye n'ọchịchị, ha ala mewa ihe masịrị ha."

Mbọ BBC gbara inweta ọsịsa Mịnịstri gọọment etiti na-ahụ maka ọkụ,ọrụ na owuwu ụlọ amịtaghị mkpụrụ.

Ha asaghbeghị anyị ozi anyị zigara ha n'intanet

Ọchịchị metụtara ọnụ n'okwu Akwa Naija nke abụọ

Image copyright Getty Images

Ọ bụghị Buhari bụ onye mbụ iji akwa Naija abụọ kwe ndị Igbo nkwa.

Onyeisiala Naijiria ochie bụ Olusegun Obasanjọ malitere okwu gbasara akwa Naija nke abụọ n'afọ 1999, oge ọchịchị ya na-abịa na njedebe.

Mgbe Goodluck Jonathan chọrọ ịbanye n'ọchịchị n'afọ 2011, akwa Naija so na nkwa o kwere Ndigbo ma ọ bụrụ na ha tụnyere ya vootu.

O mechara merie ma nye ụlọọrụ Julius Berger ọrụ akwa ahụ nke ọ mapụtara ijeri Naira 18 na ụma(N18.31 billion) nke gọọmentị kwụrụ ijeri asatọ n'ime ya.

O nweghị onye nụkwara maka ọrụ ahụ ọzọ ganye n'afọ 2015 mgbe Jonathan chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala agba nke abụọ, o bulitekwara nkwa ịrụ akwa Naija nke abụọ ọzọ.

Buhari meriri na ntuliaka ahụ ma kwụsị ọrụ n'aga n'akwammiri, si na ya ga-enyocha ka e siri nye ọrụ ngọ ya.

Mana dịka onwe ole na ole gara aga, ọchịchị Buhari malitekwara ọrụ n'akwammiri ahụ ma na-ekwe Ndigbo nkwa ịrụ ya ma ọ bụrụ na ha tụnyere ya n'afọ 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị