Christian Pulisic: Ị matala ego ole Chelsea zụrụ onye egwu bọọlụ a?

Christian Pulisic

Ebe foto si, Getty Images

Onye egwu bọọlụ bụ Christian Pulisic agalaa Chelsea ka a zụchara ya £58 million (€64m/$73m).

Chelsea ga-agbazinyeghachi ya otu egwu Dortmund ruo n'ọgwụgwụ oge 2018-19.

Nwa amala mba Amerịka kpara ike ka ọ wachara ka ọnwa n'oge 2015-2016. Site n'oge ahụ, ọgbaala ndị otu ya bụ Dortmund ugboro 115 na Bundesliga, ebe o nyere goolu 15 ma mepụta ohere inye goolu 24.

Mana ọ na-adọlị n'akụkụ otu Lucien Favre ndị gbaaliterela n'elu Bundesliga, ma ka Bayern Munich ghara ị na-ahụ azụ ha anya.

.