Obasanjo's letters: Ndị isiala chịrị Naijiria Obasanjo jiri edemede leta degide

Shagari,Buhari,Abacha,Babangida,Ya'Adua na Jonathan Image copyright Getty Images

Onye chịbuuru Naijiria bụ Olusegun Obasanjo, abụrụla okwu akpụ n'ọnụ ugbu a dịka ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria siri dị.

A marala nwa amadị a dịka onye anaghị asọ eze anya tupu ọ gwa ya okwu.

O jirila mkpịsị odee ya were menye ụfọdụ ndị chịrị Naijiria ụjọ n'anya, bụkwa nke mechara chụpụ ụfọdụ n'ime ha n'ọkwa.

Ndị isiala ahụ bụ ndị a:

Image copyright Getty Images

Alhaji Shehu Shagari:

Onye a chịrị Naijiria site n'afọ 1979 - 1983, bụ onye mbụ Obasanjọ bu ụzọ menyụọ anya site n'edemede leta ọdegaara ya mgbe e duchara ya n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ dịka onyeisiala n'ọnwa Ọktoba 1, 1983.

Ozugbo oweere oche dịka onyeisiala nke ugboro abụọ, Obasanjọ pụtara ihie ma katọọ ọchịchị ya bụ nke nọchiri anya ya dịka onyeisiala, ma kọwaa ya dịka nke na-agba ọnyụpa n'okwu akụnaụba, ma bụrụkwa nke tinyere ụmụ Naijiria n'oke ụbịa m.

O nyekwara mkpesa banyere etu mpụ si bawanye na Naijiria. Nke a nyere aka ma kpọbata ndị agha n'ọchịchị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo IBB ejighị ahụ.

Ibrahim Babangida:

Nwa amadị a chịrị Naijiria dịka onye agha bụ onye nke abụọ mkpịsị odee Ọbaasanjo metụtara.

Nke a bidoro mgbe ọchịchị ahụ wepụtara atụmatụ e ji ebelata ụbịam a kpọro 'Structural Adjustment Programme' (SAP) n'aha bekee.

A kọwara nke a dịka atụmatụ mere ka ụbịam bawanye. Nke a mekwara ka Obasanjọ gaa n'ihu n'ịgba ọchịchị ahụ ụkwụ ruo na ngwụcha ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Abacha nwụrụ na ọche ka onyeisiala Naịjirịa n'afọ 1998

Sani Abacha:

N'agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ nọọrọ na-atụ ọchịchị ndị agha nke Sani Abacha nọ n'isi ya ụjọ, Obasanjo gakwara n'ihu ma gosi ya onye ọ bụ mgbe ọ nọọrọ n'otu ụlọ ọgbakọ Arewa katọọ ọchịchị Abacha, ma kọwaa ya dịka nke kpuru isi.

Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ BBC nwere n'oge ahụ, Obasanjo boro ọchịchị Abacha ebubo irikpọ akụnaụba Naijiria dịka onye ọkwọụgbọ mmiri mmanya na-egbu.

Abacha mere ya ka ọma n' ọnya, bụ nke mere e ji tụọ ya mkpọrọ.

Ọ nọọrọ n'ụlọmkpọrọ rue mgbe Abdulsalami Abubakar weghara oche ọchịchị dịka Abacha nwụchara.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ bubuuru onyeisiala Naijiria

Umaru Musa Yar'Adua:

Ọchịchị a weghara oche dịka Ọbasanjo chịchara afọ asatọ mgbe ọchịchị ọhakarasi lọghachịtara n'afọ 1999.

Mana adị m na mma Obasanjo na Yar'Adua bidoro dawa aja aja ozugbo nwaamadị a hụtara na ọchịchị Yar'Adua na-agba ọnyụpa

Obasanjo kwupụtara uche ya n'edemede odere sị, ''Dịka ịma, n'ọnwa ole na ole na-abịa, a ga-ewe ọchịchị gị dịka nke n'ọnọdụ ndapụ nke ọchịchị Obasanjo, ma eleba anya n'ọnọdụ wetara gị n'ọchịchị. Ọ bụ ya mere ị ga-eji gbalịsia ike ma wepụtara onwe gị nakwa ọchịchị gị njirimara pụrụ iche''.

Image copyright Getty Images

Goodluck Jonathan:

Oge Yar'Adua nwụrụ n'ọkwa n'afọ 2010, osote ya bụ Goodluck Jonathan banyere n' ọkwa onyeisiala.

N'ime afọ abụọ e duchara ya n'iyiọrụ dịka a họpụtachara ya n'afọ 2011, nsogbu ya na Ọbasanjọ bidoro.

N'edemede leta o degaara ya bụ nke ọ kpọrọ ''Tupu Oge Agaa'', Obasanjo kwuru na o mere ka ọhaneze mata nke a n'ihi na od egarala Jonathan akwụkwọ a ugboro anọ, bụkwanụ nke ọ zaghachighị.

O kwuru, ''Ọnọdụ obodo a ugbu a nakwa ihe nwere ike ịbụ mpụtara ya mere m jiri n'ekwu tupu ụzọ emechie n'ihe gbasara ịkwalite adịm mma obodo anyị, ma gwa gị na egwu nọ n'ụzọ''.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya

Muhammadu Buhari:

Onyeisiala na-achị Naijiria ugbu a bụ Muhammadu Buhari, bụkwa onye nwetara nkwado pụrụ iche site n'aka Obasanjo n'afọ 2015, hụtakwara akparamagwa nwaamadị a dịka odee akwụkwọ ozi na 2018 n'ime afọ atọ ọ nọọrọ n'ọkwa n'ọchịchị.

Ọ gwara ya ka ọ kwụsị echiche ya ịzọgharị ọkwa onyeisiala n'afọ 2019, n'ihi na aka ọrụ ya kemgbe ojiri weghara ọchịchị, akụdala mụọ ndị Naijiria, bụ ndị tụnyeere ya vootu n'afọ 2015.

Obasanjo edegara Buhari akwụkwo ozi ugboro abụọ.

Na mkparitaụka ya na BBC nwere n'ọnwa Jenụwarị, 2019, Obasanjo kwuru na ọchịchị Buhari akụọla afọ n'ala, ma kwupụtakwa nkwado ya nye Atiku Abubakar nke otu pati PDP.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a