NBC akụsuola NTA, Channels TV, AIT nakwa TVC maka okwu asị

NTA,Channels TV, AIT nakwa TVC Image copyright Getty Images

Ngalaba na-elebanya na mgbasaozi n'ikuku na Naijiria nke a kpọrọ NBC n'ịchafụ achaala ụlọọrụ ntaakụkọ NTA ,Channels TV, AIT nakwa TVC ọkụ maka ịgbasa okwu asị ndị otu APC na PDP n'ikuku.

Onyeisi NBC bụ Malam Is'haq Modibbo Kawu kwupụtara nke a n'Abuja na mkparịaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere ụbọchị Wenezde mana o kwughị ụdị ahụhụ a tara ha.

O kwuru na ndị ụlọọrụ akụkọ anọ akwụsịghị ndị ndọrọndọọ ọchịchị ndị dịka ha na-ekwu okwu asị oge ha na-eme achụmta vootu ha.

Nema anabatala ụmụ Naijiria 162 ọzọ si na Libya

Image copyright NEMA

Onye nchịkọta otu gbatagbata gọọmenti etiti, ngalaba nke Legos bụ Idris Muhammed nabatara ndị ahụ n'ọdọgbọelu Murtala Muhammed International Airport, dị n' Ikeja ka o jiri ọkara gafee elekere atọ nke ụtụtụ Wenezde dịka ụgbọelu Libyan Airlines bulatara ha.

Ndị ahụ lọtara dị ụmụnwaanyị otu narị,gụnyere mmadụ anọ dị ime., ụmụnwoke iri isii na abụọ.

Ka ọ na anabata ha, Muhammed dụrụ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị ga-na agbasa ozi njọọ ọ dị ịsị Naijiria gawa mba ofesi na ejizughị akwụkwọ n'ihi oke ihe egwu so ya.

Image copyright Nema

Ọ gara n'ihu kọwaa na Nema na otu European Union na-ahụ maka itinye anya ndị chọrọ iji aka ha lọtara onwe ha ebe ha turu aro etu ha ga-esi aga n'ihu n'ọrụ ịkpọlata ndị chọrọ ịlọta.

Ụlọikpe mkpegharị akụpụla ikpe akwụkwọ Onnoghen gbara

Image copyright @CREVO360_NG

Ụlọikpe mkpegharị ajụla arịrịọ onyeọkaikpe ukwu Naijria akwụsịrị ọrụ n'ike bụ Walter Onnoghen rịọrọ ka akwụsi ikpe a na-ekpe ya na ụlọikpe ọpụrụiche Code of Conduct Tribunal.

Ụlọikpe ahụ sịrị na arịrịọ Onnoghen rịọrọ enweghị iwu kwadoro ya.

Ndị mba Venezuela na-eme ngaghariiwe

Image copyright Getty Images

N'ofesi ngaghariiwe na-aga n'ihu na mba Venezuela dịka onye ndu otu pati na-anọghị nọ ọchịchị bụ Juan Guado kpọpụtara onwe ya dịka onyeisiala n'izu gara aga.

Ngaghariiwe bidoro kemgbe abali iri abụọ na otu ọnwa Jenụwarị ka onyeisiala mba ahụ bụ Nicola Maduro bidochara agba nke abụọ ya dịka onyeisiala dịka ihe isi ike na akawanye njọ na mba ahụ.

Image copyright Getty Images

Onye egwu Manchester City bụ Rabbi Matondo ahapụla otu egwu ya ga Schalke maka nkwekọrịta ịnọ ebe ahụ afọ anọ.

Akụkọ ga-amasị gị: