Presidential Election 2019: Ntule nkwa ha dịka o siri gbasa akụnaụba Naijiria

Image copyright Getty Images/Atiku,Moghalu,Sowore,Duroto

Nke a bụ agba nke atọ na ndepụta BBC mere iji jide ndị na-azọ ọkwa onyeisiala n'okwu ha kwurula.

Ndị na-atụ vootu na Naijiria ga-agbakwasị ụkwụ n'ihe ndị na-azọ ọkwa ọchịchị kwuru

Atụmatụ a bụ iji mee ka a hapụ okwụ pati onye nọ na ya kwebe maka ọkwụ ndị dị mkpa n'ọchịchị obodo na ntulikaka a

Mana kedụ ka ị ga-esi ma ma ihe ọnye na-azọ ọkwa ọchịchị kwuru ọ bụ eziokwu?

Ka anyị chọpụta

Atiku Abubakar
Ajụjụ kacha mkpa na ntuliaka a bụ : 'Ndụ gị ọka mma ugbua karịa ka ọ dị afọ anọ gara aga? Anyị abawanyere ọgaranya ka anyị adawanyere ụbịam?
...
Nchọpụta eziokwu

Naijiria bụ ala ka nwere oke ụbịam na ahaghị nhatanha n'akụ na ihe enwe enwe. Atiku dịka ọ na-ekwu na ihe agbanwebeghị kemgbe afọ anọ, na akpachaghị anya, n'ihe kawanyere njọ.

Ihe ngụkọ na ozi enwere na-egosi na ihe o kwuru bụ eziokwu.

E jiri ihe a na-arụpụta n'ala a nke a kpọrọ GDP tụlee akụnaụba Naijiria, ala a ka na-apụta na nsogbu ọtanisi kemgbe ego mmanụ jiri daa n'ahịa mbaụwa n'afọ 2016.

Site n'afọi 2014 rue 2017, ọnọdụ ndụ ndị mmadụ si dọla 3,222 n'afọ 2014 daruo dọla 1,968 n'isi otu onye ka afọ gachara, dịka ụlọakụ mbaụwa, World Bank siri kwuo.

Ka nke a na-eme, ndịiche dị n'etiti ndị kachasị ọgaranya na ndị kachasị ogbenye na-abawanye.

Alịkọ Dangote, onye bi na Legọs bụ onye kachasị nwee ego n'Afrika. Fobes kwuru na akụ ya ruru ijeri dọla 10.5

Ihe karịrị ọkara ụmụ Naijiria nọ n'oke ụbịam dịka ha na-erị naanị otu dọla na ụma ($1.90) kwa ụbọchị. Afọ anọ gara aga, nde mmadụ iri asatọ na ise bụ ndị a gụnyere dịka ndị dara ogbenye, ọnụọgụgụ a ka na-arị kwa afọ kwa afọ. N'afọ 2016, ha dị nde mmadụ iri itoolu, n'afọ 2017, ha dị nde itoolu na anọ. N'afọ gara aga, World Bank kwuru na ụmụ Naijiria dị nde iri itoolu na asaa na-ebi n'ụbịam.

Oke ụbịam na-abawanye rue mmadụ isii kwa nkeji maọbụ mmadụ nde atọ na ụma (3.2 million) kwa afọ. Ngụkọ elekere ụbịam bụ World Poverty Clock na-ele anya na nde mmadụ otu nari iri abụọ ga-ada ụbịam dịka a na-eru afọ 2030

Ọnọdụ a ka njọ n'Ugwu-Awụsa karịa steeti ndị dị a Ndịda-Anyanwụ. Site n'afọ 2004 na 2013, ọnụ ọgụgụ ndị dara ogbenye n' ndịda jiri nde mmadụ isii gbadata, mana n'Ugwu-Awụsa, ọ galitere rue nde mmadụ asaa.

Ọnọdụ Ụbịa n'Ọwụwa-anyanwụ Mgbago Ugwu na Ọdịdaanyanwụ Mgbago Ugwu agbanweghị dịka ụbịa dị pasent 47.6% na 59% n'ebe abụọ ahụ.

Nsogbu Boko Haram so kpata ihe na-ebe na mpaghara Ugwu-Awụsa, tinyere na enweghị nkwalite akụnụba site n'aka gọọmenti.

Muhammadu Buhari
N'ọrụugbo, anyị na-etinye ego na ihe a na-etinye n'ubi, nakwa ichekwa ihe ewetara n'ubi. naanị n'afọ atọ, Naijiria emefuola nde dọla ise na-ịtụbata osikapa. Tata, ịtụbata rice akwụsichawala. Anyị nọzị na mbọ ịhụ na e nwere nri dị iche iche n'uju n'oge na adịghị anya.
... 19/12/2018
Nchọpụta eziokwu

Onyeisiala Buhari ekwughị eziokwu

N'ezie, gọọmenti etiti malitere atụmatụ Iwughari akụnaụba nke ha kpọrọ Economic Recovery and Grwoth Plan 2017-2020 mana , ha emezughị nkwa ahụ ha kwere maka osikapa rue ngwụcha 2018. Imezu nkwa ahụ n'ọka wit adịghị ka ihe ga-ekwe ha mee.

N'atụmatụ ahụ, Naijiria kwesịrị ị na-akọpụta osikapa niile a na-eri n'ala Naijiria n'afọ 2018, ma kọpụta ọka wit niile a na-eri n'ala n'afọ 2010.

N'agbanyeghị na nkọpụta osikapa na-agbalite nwayọọ,nwayọọ n'afọ ise gara aga, dịka a na-atụ anya na ọ ga-agbalitekwu n'afọ 2019 mana Naijiria ka sọ na mba ndị kachasị atụbata osikapa na mbaụwa.

N'afọ 2014, oge ọnụahịa osikapa bụ dọla narị anọ ,irir abụọ na ise, Naijiria na-atụbata osikapa ruru nde abụọ na narị 6 metrik tọns nke pụtara nde dọla atọ, puku iri abụọ na asaa, nanarị anọ( $3,027,400)

N'afọ 2018, ọnụ metrik tọns osikapa agbanweghị n'ụzọ pụrụ iche. Ugbua, osikapa na-ada dọla narị anọ iri abụọ na otu maka otu metrik tọn. Agbanyeghị na ole a na-atụbata agbadatala, ị gbakọọ ego nde metrik tọn osikapa abụọ, narị anọ, Naijiria mefuru nde dọla abụọ, narị asaa, puku iri isii na isii, iri abụọ na asaa($2,766,027.40) maọbụ nde dọla abụọ( $2.7 million) kwa ụbọchị

Ọnụọgụgụ ndị na-achọ osikapa na-arị dịka ọnụọgụgụ ụmụ Naijiria na-amụbanye. Ụmụ Naijira akwụsịbeghị mmasị ha nwere n'ebe osikapa nọ.

E nweghị nri zuru ọnụ bụ nnukwu nsogbu na Naijiria. Ọgbaghara dị na Ọwụwa-anyanwụ Mgbagougwu, nakwa mpaghara etiti Naijiria so metụta ihe a na-enweta n'ubi nakwa ego ezinaụlọ na-enweta na ire ihe ha nwetara n'ubi.

Dịka ngụkọ Global Hunger Index (GHI), Naijiria nọ n'ọkwa 103 n'ime mba 119 ebe agụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.

N'ọnwa Maach, afọ 2018, onyeisiala Buhari hiwere otu 'National Food Security Council', otu ọ bụ onye ndu ha, nye ha ọrụ ịhụ maka nchekwa nri.

Kingsley Moghalu
Ihe karịrị pasent 60 ego niile Naijiria na-akpata na-ala na ịkwụ ụgwọ nke mere na e nweghịzi ego maka iwulite obodo.
... Abali Itoolu nke ọnwa Disemba (Mkparịtaụka ya na akwụkwọ ntaakụkọPunch)
Nchọpụta eziokwu

Dịka ngụkọ pụtara nsonso na-ekwu na ụgwọ Naijiria ji gbagoro site na tari Naira asaa.55($24.66 billion) in 2012 to N22.43($73.21bn) in 2018, nke pụtara na o ji ihe karịrị pasent 196.9% were

Iji kwụcha ụgwọ,onye Naijiria ọbụla ga-akwụ N118,046.

N'afọ 2017, Naijiria nwetara tari Naira 2.7($8.89),ebe etinyere tarịị naira1.62 n'ịkwụ ụgwọ e ji eji. nke apụtara ihe ruru pasent 59.68

Nke a apụtaghị na ihe Moghalu kwuru bụ eziokwu maka na e nwere ụzọ dị iche iche e si akwụ ụgwọ e ji eji. O nweghị ụzọ a ga-esi ama na e wepụrụ N1.62tn ($5.3b) ego niile

E ji ụgwọ eji agbanyere GDP iji gbakọ mba nwere ike ịkwụ ụgwọ ha ji site na ile ego ole ha ji nakwa ego ha na-akpata

N'afọ 2018, mgbakọ ụgwọ Naijiria ji na ego ha na-enweta,bụ pasent 19.72, ka ji pasent 12.65 karịa ihe ọ bụ n'afọ 2013.a

Ụgwọ eji na ilo bụ ụgwọ e ji mba ndị ọzọ na otu ndị abụghị nke ala a. pasent 29.49 ụgwọ e ji bụ nke e ji ndị mba ọzọ.

N'afọ 2017, ahụike, iwulite ọnọdụ ndị mmadụ, ọrụugbo nakwa njem ọkporoụzọ so n' ebe e tinyere ego agbatara na mbibi na mba ọzọ.

N'afọ 2019, ihe ruru pasent 25.65 bụ ihe am mabụtara aga-etinye n' ịkwụ ụgwọ

Omoyele Sowore
I he m na-akwado bụ ịmabụta ijeri dọla 3.6 ka anyị arụmarụ biri ọkụ ebe niile n'ala anyị. Ụlọ dị nde iri na asaa dị mkpa n'ihi na ihe karịrị nde mmadụ iri asatọ enweghị ebe obibi. Anyị kwesịrị ime ka ọ bụrụ na mmadụ ise ọbụla; nna,nne, ụmụaka atọ, nwere otu ụlọ.
Nchọpụta eziokwu

N'afọ 2012, Mịnịstrị gọọmenti etiti na-ahụ maka ebe obibi kwuru na Naijiria nwere mkpa nde ụlọ iri na asaa, dịka ngụkọ nke World Bank. Gọọmenti na-agụkọ na afọ 2014, mkpa ụlọ ga-eruola nde iri atọ maọbụ nde iri anọ.

Mana 'World Bank' chọpụtara na ngụkọ nke afọ 2012 pekarịrị ihe ọ bụ n'ezie n'ihi na Naijiria iji mgbakọ na mmadụ isii ga-ebi n'otu ụlọ gbakọọ ya, ebe ngụkọ mbaụwa bụ mmadụ anọ na ụma(4.6) n'otu ụlọ. 'World Bank' na-ekwu na mkpa ụlọ e nwere bụ nde ụlọ iri atọ.

Kemgbe afọ 2012, e nwebeghị nchọpụta ụlọ ole e kwesịrị inwe, ya bụ a maghị mkpa ụlọ ole dị

A na-ekwukarị mkpa ụlọ nde iri na asaa Mana o nweghị ọnye na-etinye uche na ụmụ Naijiria na-abawanye.

Ọ ga-ahịa ahụ ikata mmadụ ole enweghị ụlọ na Naijiria. E nwebeghị agụmọnụ kemgbe afọ 2006 dịka ọgbaghara na-emegasị ugbu mere ka ụfọdụ ụmụ Naijiria gbapụ na be ha.

Mana n'afọ 2017, The Bureau of Public Service Reform kwuru na ihe ruru mmadụ 108 na Naijiria enweghị ebe obibi.

E were ngụkọ mmadụ ise na otu ụlọ tulee ya, mmadụ nde 108 enweghị ụlọ, mkpa ụlọ e nwere bụ ụlọ nde iri abụọ na isii.

Nde dọla 3.6 Sowere na-ekwu maka ya ga-ezu ịrụta naanị ụlọ narị atọ, puku iri isii.

Fela Durotoye
Ọ bụrụ na anyị hazie ọrụugbọ, nke anyị ma bụ ọrụ pasent iri isii ndị Naijiria na-arụ ugbua, agbanyeghị na ọ bụ naanị pasent iri atọ na ise ala ka a na-akọ ihe. Anyị ga-eme ka ala a na-akọ gbalite rue pasent iri ise. Nke a ga-eneye anyị ohere ka mmadụ ruru nde iri atọ banye n'ọrụugbo.
... Ụbọchị 19 nke Jenụwarị 2019 (Nrụrịtaụka ọkwa onyeisiala)
Nchọpụta eziokwu

N'ime ndị nwere ọrụ na Naijiria, ndị ọrụugbo kachasị. Ngụkọ nke ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ bụ NBS wepụtara kwuru na pasent iri anọ na asatọ (28.2) ndịọrụ nọ n'ọrụugbo.

Pasent iri na anọ (14%) nọ n'azụmahịa, nke bụ ọrụ nke abụọ kachasị ụmụ Naijiria nọ na ya.

Fela Durotoye kwuru eziokwu ikwupụta na ọrụugbo bụ ebe ndị Naijiria ka nọrọ. Mana pasent ndị nọ n'ọrụugbo pekarịrị ihe o kwuru

Maazị Durotoye ekwụghị asi mgbe ọ sị na sọsọ pasentị iri atọ n'ise (35%) n'ala anyị ka anyị ji eme ihe.

Naanị pasent iri atọ na asaa ala Naijiria bụ ihe a na-akọ.(34,000,000 heactares) dịka World Bank siri kwuo n'afọ 2016. Ọnụọgụgụ a agbanwebeghi kemgbe afọ 2011.

Ụlọakụ mbaụwa gosiri na e ji pasentị iri asaa na asaa (77.7%) ala Naịjirịa akọ ugbo. Ihe ọ pụtara ruru (708,000 n'ọnụọgụgụ kilomita)

MMEKỌRỊTA Pia maọbụ metụ ka i nwe mmekọrịta

Nchọpụta eziokwu

Anyị na-agba mbo iwepụta nkọwa okwu si n'ọnụ ndị ndọrọndọrọ n'usoro ga-enyere eziokwu ohere ịchị, site na-iji ihe Bekee kpọrọ "data" ga-eru mmadụ niile aka.

Anyị ga-etinye uche na ihe dịrị ime obodo di iche iche mkpa, dịka ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche si kwuputa ha.