Nnamdi Kanu, gbara ọgwụ gị ṅụọ - Nnia Nwodo

Dave Umahi, Nnamdi Kanu na Nnia Nwodo, Image copyright BBC/Getty

Ndị Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ agọọla ebubo na ha ma ime mere ede jiri bee nwịị na ihe nnamdi Kanu gabigara n'oge Ndịagha Naijiria gbara Egwu Eke n'ụlọ ya.

Na mkparịtaụka BBC Igbo na nnamdị Kanu nwere na Lọndọn na nsonso, nwa amadị ahụ bọrọ ebubo na Umahi na gọvanọ ndị ọzọ tinyere Ohaneze kpara nkata igbu ya.

Mana aka na-achị Ebonyi steeti ma bụrụkwa onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ bụ Dave Umahi kwuru na aka ha dị ọcha n'ebe Kanu nọ.

O kwuru na ọ bụ Kanu bụ isi kotere ebu gbara ya n'ihi nọ o geghị ntị na ndụmọdụ Ndị gọvanọ na ndị okenye igbo nyere ya.

Umahi kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Emma Uzor, sịrị na "ọ bụghị eziokwu."

Uzor kọwara na Gọvanọ Umahi gara mba ofesi oge ndịagha wakporo ụlọ Kanu.

O kwukwara na Umahi bụ onye bekuru onyeisiala ngwangwa ọ nụrụ ihe mere ka ha kpọbụ Ndị agha n'ụlọ Kanu n'ihi na ọnọdụ ha ebe ahụ na-ebute ọgbaghara na ogbụgbu mmadụ.

"Ka awakporo Nnamdị Kanu Gọvanọ batara hụ ihe na-eme kpọọ onyeisiala ka ha kpọbụ Ndịagha n'ụlọ Nnamdị Kanọ."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'O bu Umahi rịọrọ Onyeisiala e were kpọbụ ndịagha wakporo ụlọ Nnamdi Kanu'

Uzor kọwara na ndị gọvanọ na Nnamdị nwere ọgbakọ ebe ha nọrọ nwe nkwekọrịta na Kanu ga-eji nwayọo so okwu mnwereonwe Ndigbo, hapụ ị na-akparị ndị okenye n'agbụrụ Yoruba,Igbo na Awụsa.

Ha boro Kanu ebubo ịgbahapụ nkwekọrịta ha na ndị gọvanọ nwere.

Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo, onyeisis otu Ohaneze kwenyere na nhazighari Naijiria na mpaghara na mpaghara

N'ọsịsa ya, onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo onye kwuru na 'ọ bụghị ụja niile Nnamdi Kanu gbọrọ ka anyị ga na-asa" kwuru na ebubo Nnamdị Kanu bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ.

Nwodo siri ọ kaa Kanu obi ya wepụta ihe akaebe gọsịrị na Ohaneze soro kpaa nkata igbu ya.

"Nke a bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ. Ọ ka ya obi ya weta ọbụladị mpekere ihe akaebe."

Ọ gara n'ihu jụọ ihe mere Kanu ji adonyere ndị iro Ndigbo ukwu site na ịkpọ oku ka a ghara ịtụ vootu."

Akụkọ ga-amasị gị: